< Abụ Ọma 6 >
1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke e ji ụbọ akwara abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe. Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị.
Don mai bi da kaɗe-kaɗe. Da kayan kiɗi masu tsirkiya. Bisa ga sheminit. Ta Dawuda. Ya Ubangiji, kada ka tsawata mini cikin fushinka ko ka hore ni cikin hasalarka.
2 Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike. Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu.
Ka yi mini jinƙai, Ubangiji, gama na suma; Ya Ubangiji, ka warkar da ni, gama ƙasusuwana suna zafin ciwo.
3 Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị?
Raina yana cikin wahala. Har yaushe, ya Ubangiji, har yaushe?
4 Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m; nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m.
Ka juyo, ya Ubangiji, ka cece ni; ka cece ni saboda madawwamiyar ƙaunarka.
5 Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị. O nwere onye na-eto gị site nʼala ili? (Sheol )
Babu wanda yakan tuna da kai sa’ad da ya mutu. Wa ke yabonka daga kabari? (Sheol )
6 Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude. Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri, ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m.
Na gaji tiƙis daga nishi. Dukan dare na jiƙe gadona da kuka na jiƙe kujerata da hawaye.
7 Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute; ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m.
Idanuna sun rasa ƙarfi da baƙin ciki; sun rasa ƙarfi saboda dukan abokan gābana.
8 Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe, nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile.
Ku tafi daga gare ni, dukanku masu aikata mugunta, gama Ubangiji ya ji kukata.
9 Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere. Ọ nabatala ekpere m.
Ubangiji ya ji kukata saboda jinƙansa; Ubangiji ya karɓi addu’ata.
10 Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme. Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.
Dukan abokan gābana za su sha kunya su kuma karaya; za su juya da kunya nan da nan.