< Abụ Ọma 59 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Devid. Abụ miktam nke eji olu abụ “E bibikwala,” abụ. Mgbe Sọl zipụrụ ndị ikom ka e chee ụlọ Devid nche nʼihi igbu ya. O Chineke, site nʼaka ndị iro m gbapụta m, chebe m site nʼaka ndị na-ebili imegide m.
[For the Chief Musician. To the tune of "Do Not Destroy." A poem by David, when Saul sent, and they watched the house to kill him.] Deliver me from my enemies, my God. Set me on high from those who rise up against me.
2 Gbapụta m site nʼaka ndị na-eme ajọ ihe, zọpụtakwa m site nʼaka ndị ogbu mmadụ.
Deliver me from evildoers. Save me from the bloodthirsty men.
3 Lee ka ha siri zoo onwe ha nʼihi ịnapụ m ndụ! Ndị na-eme ihe ike na-agba izu megide m, o Onyenwe anyị, ma ọ bụghị nʼihi ihe m mere maọbụ mmehie m.
For, look, they lie in wait for my soul. The mighty gather themselves together against me, not for my disobedience, nor for my sin, Jehovah.
4 Mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ m mere, ma lee ha dị njikere imegide m. Bilie, bịa nyere m aka; lee ihe ọjọọ dakwasịrị m!
I have done no wrong, yet they are ready to attack me. Rise up, look, and help me.
5 Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gị onye bụ Chineke nke Izrel, kpọtee onwe gị ịta mba niile dị iche iche ahụhụ; e gosikwala ndị na-ezube nzube ọjọọ obi ebere. (Sela)
You, Jehovah, the God of hosts, the God of Israel, rouse yourself to punish the nations. Show no mercy to the wicked traitors. (Selah)
6 Nʼanyasị, ha na-alaghachi, na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.
They return at evening, howling like dogs, and prowl around the city.
7 Lee ihe ha si nʼọnụ ha na-aghụpụta, okwu si nʼọnụ ha na-agbụpụta dị nkọ dịka mma agha, ha na-asịkwa, “Onye pụrụ ịnụ ihe anyị na-ekwu?”
Look, they spew with their mouth. Swords are in their lips, "For," they say, "who hears us?"
8 Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị; ị na-akwa mba ndị a niile emo.
But you, Jehovah, laugh at them. You scoff at all the nations.
9 O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike.
Oh, my Strength, I watch for you, for God is my high tower.
10 Chineke m, onye m tụkwasịrị obi. Chineke ga-ebutere m ụzọ mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị.
My God of mercy will come to meet me. God will let me look at my enemies in triumph.
11 O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha, ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu. Were ike gị mee ka ha wagharịa, wedakwaa ha nʼala.
Do not kill them, or my people may forget. Scatter them by your power, and bring them down, Jehovah our shield.
12 Ka e jide ha nʼime nganga ha, nʼihi mmehie si ha nʼọnụ na-apụta, na nʼihi okwu ọnụ ha. Nʼihi okwu ọbụbụ ọnụ ha na okwu ụgha ha,
For the sin of their mouth, and the words of their lips, let them be caught in their pride, for the curses and lies which they utter.
13 jiri iwe ọkụ repịa ha, repịa ha ruo mgbe ha ga-aghọ ntụ. Mgbe ahụ, a ga-amata ruo na nsọtụ nke ụwa, na Chineke na-achị Jekọb.
Consume them in wrath. Consume them, and they will be no more. Let them know that God rules in Jacob, to the farthest parts of the earth. (Selah)
14 Nʼanyasị ha na-alaghachi; na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta, mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.
At evening let them return. Let them howl like a dog, and go around the city.
15 Ha na-awagharị na-achọ nri, na-etikwa mkpu ma ọ bụrụ na afọ ejughị ha.
They shall wander up and down for food, and wait all night if they aren't satisfied.
16 Ma aga m abụ abụ banyere ike gị, nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị; ị bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.
But I will sing of your strength. Yes, I will sing aloud of your loving kindness in the morning. For you have been my high tower, a refuge in the day of my distress.
17 O, gị onye bụ ike m, ana m abụku gị abụ otuto; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-adabere.
To you, my strength, I will sing praises. For God is my high tower, the God of my mercy.

< Abụ Ọma 59 >