< Abụ Ọma 58 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Devid. Abụ miktam. Unu ndị na-achị achị, O nweela oge unu na-ekwu ihe ziri ezi? O nweela oge unu na-ekpe ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ?
“For the leader of the music. To the tune of “Do not destroy.” A psalm of David.” Do ye, indeed, administer justice faithfully, ye mighty ones? Do ye judge with uprightness, ye sons of men?
2 Mba, nʼime obi unu, unu na-echepụta mmegbu, aka unu na-emepụta ihe ike nʼelu ụwa.
Nay, in your hearts ye contrive iniquity; Your hands weigh out violence in the land!
3 Ọ bụladị site nʼọmụmụ, ndị ajọ omume na-akpafu; site nʼime afọ, ha na-akpafu akpafu na-ekwusa okwu ụgha.
The wicked are estranged, from their very birth; The liars go astray as soon as they are born.
4 Ha na-agbọpụta nsi nʼọnụ ha dịka agwọ, na-emechi ntị ha dịka ajụala ntị chiri,
They have poison, like the poison of a serpent; Like the deaf adder's, which stoppeth her ear;
5 nke na-adịghị anụ olu onye mgbaasị na-akpọpụta ya, nʼagbanyeghị otu ǹka onye ahụ si dị.
Which listeneth not to the voice of the charmer, And of the sorcerer, skilful in incantations.
6 O Chineke, tijie eze niile dị ha nʼọnụ; o Onyenwe anyị, dọpụta eze ọdụm ndị a!
Break their teeth, O God! in their mouths! Break out the great teeth of the lions, O LORD!
7 Mee ka ha sọfuo dịka mmiri na-asọ asọ; mgbe ha na-eseti ụta ha, mee ka ọnụ àkụ ha gbajie.
May they melt like waters, which flow away; May their arrows, when they aim them, be as if cut in pieces!
8 Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya; dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ.
May they be like the snail, which melteth away as it goeth; Like the abortion of a woman, that seeth not the sun!
9 Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu, ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume.
Before your pots feel the heat of the thorns, Whether fresh, or burning, may they be blown away!
10 Ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ mgbe a bọọrọ ha ọbọ, mgbe ha ga-asacha ụkwụ ha nʼime ọbara ndị ajọ omume.
The righteous shall rejoice, when he seeth such vengeance; He shall bathe his feet in the blood of the wicked.
11 Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ekwu sị, “Nʼezie, a na-akwụghachi ndị ezi omume ụgwọ; nʼezie, e nwere Chineke onye na-ekpe ụwa ikpe.”
Then shall men say, “Truly there is a reward for the righteous! Truly there is a God who is judge upon the earth!”

< Abụ Ọma 58 >