< Abụ Ọma 56 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Ọ bụ olu abụ “Nduru nọ nʼosisi Ook dị ebe dị anya.” Abụ nke Devid ka eji agụ ya. Abụ miktam. Mgbe ndị Filistia nọchibidoro ya nʼobodo Gat. O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ndị mmadụ ji ike na-achụso m; ogologo ụbọchị niile, ha na-ebu agha imegide m.
Woba lomusa kimi, Nkulunkulu, ngoba umuntu ufuna ukungiginya; usuku lonke esilwa uyangicindezela.
2 Ogologo ụbọchị niile ndị iro m na-achụso m; site na nganga ha, ọtụtụ na-ebu agha megide m.
Izitha zami zifuna ukungiginya usuku lonke, ngoba zinengi ezilwa zimelene lami ngokuziphakamisa.
3 Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.
Mhla ngisesaba, mina ngizathemba kuwe.
4 Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya, nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m?
KuNkulunkulu ngizadumisa ilizwi lakhe, kuNkulunkulu ngiyathemba, angiyikwesaba. Inyama ingenzani kimi?
5 Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi; oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ.
Usuku lonke baphambanisa amazwi ami; yonke imicabango yabo imelene lami ngokubi.
6 Ha na-agba izu nzuzo na-ezokwa onwe ha, ha na-enyochapụta nzọ ụkwụ m niile, dịkwa njikere ịnapụ m ndụ m.
Bayabuthana, bagugube, bona baqaphelise izinyathelo zami, lapho belindele umphefumulo wami.
7 Nʼihi ajọ omume ha, ekwekwala ka ha gbapụ; o Chineke, nʼime iwe gị, wedaa mba ndị a niile dị iche iche nʼala.
Bazaphunyuka yini ngobubi? Ekuthukutheleni wisela phansi abantu, Nkulunkulu.
8 Depụta akwa arịrị m; chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị. Ọ bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị?
Ukuzulazula kwami ukubalile; wena faka izinyembezi zami embodleleni yakho; kazikho ogwalweni lwakho yini?
9 Mgbe m ga-akpọku gị maka enyemaka, ndị iro m ga-agbaghachi azụ. Site nʼụzọ dị otu a, aga m amara na Chineke nọnyeere m.
Khona izitha zami zizabuyela emuva mhla ngibizayo. Ngiyakwazi lokhu ukuthi uNkulunkulu ukimi.
10 Nʼime Chineke, onye m na-eto okwu ya, nʼime Onyenwe anyị, onye m na-eto okwu ya,
KuNkulunkulu ngizadumisa ilizwi, eNkosini ngizadumisa ilizwi.
11 nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?
KuNkulunkulu ngiyathemba, angiyikwesaba. Umuntu angenzani kimi?
12 O Chineke m, nʼisi m ka nkwa niile m kwere gị dị; aga m ewetara gị onyinye ekele m niile.
Nkulunkulu, izifungo zakho ziphezu kwami; ngizabuyisela kuwe izindumiso.
13 Nʼihi na ị zọpụtala m site nʼọnwụ, ma napụta ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ, ka m nwee ike jegharịa nʼihu Chineke, nʼìhè nke ndụ.
Ngoba uwukhulule umphefumulo wami ekufeni, yebo, inyawo zami ekukhubekeni, ukuze ngihambe phambi kukaNkulunkulu ekukhanyeni kwabaphilayo.

< Abụ Ọma 56 >