< Abụ Ọma 56 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Ọ bụ olu abụ “Nduru nọ nʼosisi Ook dị ebe dị anya.” Abụ nke Devid ka eji agụ ya. Abụ miktam. Mgbe ndị Filistia nọchibidoro ya nʼobodo Gat. O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ndị mmadụ ji ike na-achụso m; ogologo ụbọchị niile, ha na-ebu agha imegide m.
To the Overseer. — 'On the Dumb Dove far off.' — A secret treasure of David, in the Philistines' taking hold of him in Gath. Favour me, O God, for man swallowed me up, All the day fighting he oppresseth me,
2 Ogologo ụbọchị niile ndị iro m na-achụso m; site na nganga ha, ọtụtụ na-ebu agha megide m.
Mine enemies have swallowed up all the day, For many [are] fighting against me, O most High,
3 Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.
The day I am afraid I am confident toward Thee.
4 Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya, nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m?
In God I praise His word, in God I have trusted, I fear not what flesh doth to me.
5 Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi; oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ.
All the day they wrest my words, Concerning me all their thoughts [are] for evil,
6 Ha na-agba izu nzuzo na-ezokwa onwe ha, ha na-enyochapụta nzọ ụkwụ m niile, dịkwa njikere ịnapụ m ndụ m.
They assemble, they hide, they watch my heels, When they have expected my soul.
7 Nʼihi ajọ omume ha, ekwekwala ka ha gbapụ; o Chineke, nʼime iwe gị, wedaa mba ndị a niile dị iche iche nʼala.
By iniquity they escape, In anger the peoples put down, O God.
8 Depụta akwa arịrị m; chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị. Ọ bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị?
My wandering Thou hast counted, Thou — place Thou my tear in Thy bottle, Are they not in Thy book?
9 Mgbe m ga-akpọku gị maka enyemaka, ndị iro m ga-agbaghachi azụ. Site nʼụzọ dị otu a, aga m amara na Chineke nọnyeere m.
Then turn back do mine enemies in the day I call. This I have known, that God [is] for me.
10 Nʼime Chineke, onye m na-eto okwu ya, nʼime Onyenwe anyị, onye m na-eto okwu ya,
In God I praise the word, In Jehovah I praise the word.
11 nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?
In God I trusted, I fear not what man doth to me,
12 O Chineke m, nʼisi m ka nkwa niile m kwere gị dị; aga m ewetara gị onyinye ekele m niile.
On me, O God, [are] Thy vows, I repay thank-offerings to Thee.
13 Nʼihi na ị zọpụtala m site nʼọnwụ, ma napụta ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ, ka m nwee ike jegharịa nʼihu Chineke, nʼìhè nke ndụ.
For Thou hast delivered my soul from death, Dost Thou not my feet from falling? To walk habitually before God in the light of the living!

< Abụ Ọma 56 >