< Abụ Ọma 55 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. O Chineke, nụrụ ekpere m, agbakwala arịrịọ m nkịtị;
למנצח בנגינת משכיל לדוד האזינה אלהים תפלתי ואל תתעלם מתחנתי׃
2 ṅaa m ntị, zaakwa m. Echiche m na-esogbu m; ana m asụkwa oke ude
הקשיבה לי וענני אריד בשיחי ואהימה׃
3 nʼihi ihe onye iro m na-ekwu, nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ, na-akpagbu m nʼiwe ha.
מקול אויב מפני עקת רשע כי ימיטו עלי און ובאף ישטמוני׃
4 Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m; oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m.
לבי יחיל בקרבי ואימות מות נפלו עלי׃
5 Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m; oke egwu ekpuchiela m.
יראה ורעד יבא בי ותכסני פלצות׃
6 Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru! Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike.
ואמר מי יתן לי אבר כיונה אעופה ואשכנה׃
7 Agaara m efelaga ebe dị anya, ga nọrọ nʼọzara; (Sela)
הנה ארחיק נדד אלין במדבר סלה׃
8 Agaara m eme ngwangwa gaa nʼebe mgbaba m, ebe dị anya site nʼebe ifufe siri ike na oke ifufe dị.”
אחישה מפלט לי מרוח סעה מסער׃
9 O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu, nʼihi na ana m ahụ ihe ike na ịlụ ọgụ nʼime obodo.
בלע אדני פלג לשונם כי ראיתי חמס וריב בעיר׃
10 Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya; iro na mmegbu dị nʼime ya.
יומם ולילה יסובבה על חומתיה ואון ועמל בקרבה׃
11 A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo; ihe ike na ụgha ewerela ọnọdụ ha nʼime obodo.
הוות בקרבה ולא ימיש מרחבה תך ומרמה׃
12 A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị, apụrụ m ịnagide ya; a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m, apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ.
כי לא אויב יחרפני ואשא לא משנאי עלי הגדיל ואסתר ממנו׃
13 Maọbụ gị, nwoke dịka m, onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma,
ואתה אנוש כערכי אלופי ומידעי׃
14 onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ, nʼụlọ Chineke, ka anyị na-ejegharị nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe.
אשר יחדו נמתיק סוד בבית אלהים נהלך ברגש׃
15 Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede; ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ, nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha. (Sheol h7585)
ישימות עלימו ירדו שאול חיים כי רעות במגורם בקרבם׃ (Sheol h7585)
16 Ma akpọkuru m Chineke, Onyenwe anyị na-azọpụtakwa m.
אני אל אלהים אקרא ויהוה יושיעני׃
17 Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị, ka m sitere nʼoke ihe mgbu, na-akpọku ya ma ọ na-anụkwa olu m.
ערב ובקר וצהרים אשיחה ואהמה וישמע קולי׃
18 Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ, site nʼagha niile e busoro m, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m.
פדה בשלום נפשי מקרב לי כי ברבים היו עמדי׃
19 Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi, onye na-adịghị agbanwe, ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ, nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke. (Sela)
ישמע אל ויענם וישב קדם סלה אשר אין חליפות למו ולא יראו אלהים׃
20 Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya, ọ na-emerụ ọgbụgba ndụ ya ka ọ ghara ịdị nsọ.
שלח ידיו בשלמיו חלל בריתו׃
21 Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ ka bọta, ma ibu agha juru ya obi; okwu ya niile dị nro karịa mmanụ, ma ha bụ mma agha e welitere maka ibu agha.
חלקו מחמאת פיו וקרב לבו רכו דבריו משמן והמה פתחות׃
22 Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile, ọ ga-agba gị ume; ọ gaghị ekwe ka ewezuga onye ezi omume.
השלך על יהוה יהבך והוא יכלכלך לא יתן לעולם מוט לצדיק׃
23 Ma gị, O Chineke, ga-adọtu ndị ajọ omume nʼime olulu nke jupụtara nʼire ure; ndị ogbu mmadụ na ndị aghụghọ agaghị ebi ọ bụladị ọkara ndụ ha. Ma mụ onwe m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.
ואתה אלהים תורדם לבאר שחת אנשי דמים ומרמה לא יחצו ימיהם ואני אבטח בך׃

< Abụ Ọma 55 >