< Abụ Ọma 54 >

1 Abụ Ọma Devid. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. Mgbe ndị Zif gara sị Sọl, “Devid ọ dịghị ezo nʼetiti anyị?” O Chineke, jiri aha gị zọpụta m; jirikwa ike gị kpepụta m.
Kwa mwimbishaji. Na ala za nyuzi za uimbaji. Utenzi wa Daudi. Wakati Wazifu walimwendea Sauli na kumjulisha, “Je, Daudi hajifichi miongoni mwetu?” Ee Mungu uniokoe kwa jina lako, unifanyie hukumu kwa uwezo wako.
2 O Chineke, nụrụ ekpere m; gee ntị nʼokwu ọnụ m.
Ee Mungu, sikia maombi yangu, usikilize maneno ya kinywa changu.
3 Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha; ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m, ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. (Sela)
Wageni wananishambulia, watu wakatili wanayatafuta maisha yangu, watu wasiomjali Mungu.
4 Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; onyenwe m bụ onye na-agba m ume.
Hakika Mungu ni msaada wangu, Bwana ndiye anayenitegemeza.
5 Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m; nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi.
Mabaya na yawarudie wale wanaonisingizia, kwa uaminifu wako uwaangamize.
6 Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja; O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma.
Nitakutolea dhabihu za hiari; Ee Bwana, nitalisifu jina lako kwa kuwa ni vyema.
7 Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile, ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.
Kwa maana ameniokoa katika shida zangu zote, na macho yangu yamewatazama adui zangu kwa ushindi.

< Abụ Ọma 54 >