< Abụ Ọma 53 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Mahalat. Abụ maskil Devid. Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.
למנצח על מחלת משכיל לדוד אמר נבל בלבו אין אלהים השחיתו והתעיבו עול אין עשה טוב׃
2 Chineke sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya, ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta, onye nke na-achọ Chineke.
אלהים משמים השקיף על בני אדם לראות היש משכיל דרש את אלהים׃
3 Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị otu onye.
כלו סג יחדו נאלחו אין עשה טוב אין גם אחד׃
4 Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe? Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri, ha adịghị akpọkukwa Chineke.
הלא ידעו פעלי און אכלי עמי אכלו לחם אלהים לא קראו׃
5 Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu, ebe ọ dịghị ihe egwu na-adịghị. Chineke fesasịrị ọkpụkpụ ndị niile megidere gị; i mere ka ihere mee ha, nʼihi na Chineke ajụla ha.
שם פחדו פחד לא היה פחד כי אלהים פזר עצמות חנך הבשתה כי אלהים מאסם׃
6 O, a sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta! Mgbe Chineke ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha, ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!
מי יתן מציון ישעות ישראל בשוב אלהים שבות עמו יגל יעקב ישמח ישראל׃

< Abụ Ọma 53 >