< Abụ Ọma 51 >
1 Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko. O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile.
Kwa mwimbishaji. Zaburi ya Daudi. Baada ya kukemewa na nabii Nathani kwa kuzini na Bathsheba. Ee Mungu, unihurumie, kwa kadiri ya upendo wako usiokoma, kwa kadiri ya huruma yako kuu, uyafute makosa yangu.
2 Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha.
Unioshe na uovu wangu wote na unitakase dhambi yangu.
3 Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile.
Kwa maana ninajua makosa yangu, na dhambi yangu iko mbele yangu daima.
4 Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.
Dhidi yako, wewe peke yako, nimetenda dhambi na kufanya yaliyo mabaya machoni pako, ili uthibitike kuwa wa kweli unenapo, na kuwa na haki utoapo hukumu.
5 Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.
Hakika mimi nilizaliwa mwenye dhambi, mwenye dhambi tangu nilipotungwa mimba kwa mama yangu.
6 Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo; ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo.
Hakika wewe wapendezwa na kweli itokayo moyoni, ndani sana ya moyo wangu wanifundisha hekima.
7 Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha; sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.
Nioshe kwa hisopo, nami nitakuwa safi, unisafishe, nami nitakuwa mweupe kuliko theluji.
8 Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ; ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa.
Unipe kusikia furaha na shangwe, mifupa uliyoiponda na ifurahi.
9 Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị, hichapụkwa mmehie m niile.
Ufiche uso wako usizitazame dhambi zangu, na uufute uovu wangu wote.
10 Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.
Ee Mungu, uniumbie moyo safi, uifanye upya roho ya uthabiti ndani yangu.
11 Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.
Usinitupe kutoka mbele zako wala kuniondolea Roho wako Mtakatifu.
12 Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m.
Unirudishie tena furaha ya wokovu wako, unipe roho ya utii, ili initegemeze.
13 Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị, ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị.
Ndipo nitakapowafundisha wakosaji njia zako, na wenye dhambi watakugeukia wewe.
14 O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m, ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị.
Ee Mungu, Mungu uniokoaye, niokoe na hatia ya kumwaga damu, nao ulimi wangu utaimba juu ya haki yako.
15 O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, ka m kwupụta otuto gị.
Ee Bwana, fungua midomo yangu, na kinywa changu kitatangaza sifa zako.
16 Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ.
Wewe hupendezwi na dhabihu, au ningaliileta, hufurahii sadaka za kuteketezwa.
17 Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.
Bali dhabihu za Mungu ni roho iliyovunjika, moyo uliovunjika wenye toba, Ee Mungu, hutaudharau.
18 Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu; i wulie mgbidi niile nke Jerusalem.
Kwa wema wa radhi yako uifanye Sayuni istawi, ukazijenge upya kuta za Yerusalemu.
19 Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja, aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ; mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.
Hapo ndipo kutakapokuwa na dhabihu za haki, sadaka nzima za kuteketezwa za kukupendeza sana, pia mafahali watatolewa madhabahuni mwako.