< Abụ Ọma 51 >

1 Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko. O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile.
[For the Chief Musician. A Psalm by David, when Nathan the prophet came to him, after he had gone in to Bathsheba.] Have mercy on me, God, according to your loving kindness. According to the multitude of your tender mercies, blot out my transgressions.
2 Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha.
Wash me thoroughly from my iniquity. Cleanse me from my sin.
3 Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile.
For I know my transgressions. My sin is constantly before me.
4 Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.
Against you, and you only, have I sinned, and done that which is evil in your sight; that you may be proved right when you speak, and justified when you judge.
5 Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.
Look, I was brought forth in iniquity. In sin my mother conceived me.
6 Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo; ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo.
Look, you desire truth in the inward parts. You teach me wisdom in the inmost place.
7 Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha; sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.
Purify me with hyssop, and I will be clean. Wash me, and I will be whiter than snow.
8 Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ; ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa.
Let me hear joy and gladness, That the bones which you have broken may rejoice.
9 Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị, hichapụkwa mmehie m niile.
Hide your face from my sins, and blot out all of my iniquities.
10 Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.
Create in me a clean heart, O God. Renew a right spirit within me.
11 Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.
Do not throw me from your presence, and do not take your holy Spirit from me.
12 Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m.
Restore to me the joy of your salvation. Uphold me with a willing spirit.
13 Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị, ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị.
Then I will teach transgressors your ways. Sinners shall be converted to you.
14 O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m, ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị.
Deliver me from bloodguiltiness, O God, the God of my salvation. My tongue shall sing aloud of your righteousness.
15 O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, ka m kwupụta otuto gị.
Lord, open my lips. My mouth shall declare your praise.
16 Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ.
For you do not delight in sacrifice, or else I would give it. You have no pleasure in burnt offering.
17 Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.
The sacrifices of God are a broken spirit. A broken and contrite heart, O God, you will not despise.
18 Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu; i wulie mgbidi niile nke Jerusalem.
Do well in your good pleasure to Zion. Build the walls of Jerusalem.
19 Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja, aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ; mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.
Then you will delight in the sacrifices of righteousness, in burnt offerings and in whole burnt offerings. Then they will offer bulls on your altar.

< Abụ Ọma 51 >