< Abụ Ọma 50 >

1 Abụ Ọma Asaf. Onyenwe anyị, Chineke, Onye kachasị chi niile, ekwuola okwu ma kpọkọta ụwa niile, site na ọwụwa anyanwụ ruo na ọdịda ya.
Asaf dwom. Tweduampɔn, Onyankopɔn, Awurade no kasa, na ɔfrɛ asase nyinaa efi apuei kosi atɔe.
2 Chineke na-enwupụta dịka ìhè, site na Zayọn, nke zuruoke nʼime ịma mma.
Onyankopɔn hyerɛn fi Sion kurow a ne fɛ wie pɛyɛ.
3 Chineke anyị na-abịa, ọ gaghị emechikwa ọnụ; ọkụ na-erepịa erepịa dị nʼihu ya, oke ifufe na-efesi ike gbakwara ya gburugburu.
Yɛn Nyankopɔn reba nanso ɔrenyɛ komm; ogya a ɛhyew nneɛma di nʼanim, ahum a ɛretu atwa ne ho ahyia.
4 Ọ na-akpọku eluigwe na ụwa ka o kpee ndị ya ikpe: Ọ na-asị,
Ɔfrɛ ɔsorosoro ne asase, sɛ ɔrebu ne nkurɔfo atɛn;
5 “Chikọtaranụ m ndị m e doro nsọ, bụ ndị mụ na ha ji ịchụ aja gbaa ndụ.”
Ɔka se, “Boaboa nnipa a wɔatew wɔn ho no ano ma me; wɔn a wɔnam afɔrebɔ so ne me yɛɛ apam no.”
6 Eluigwe na-ekwupụta ezi omume ya, nʼihi na Chineke nʼonwe ya bụ onye ikpe. (Sela)
Ɔsoro pae mu ka ne trenee, na Onyankopɔn ankasa ne otemmufo.
7 “Nụrụnụ, ndị m, m ga-ekwukwa, Izrel, aga m agba ama megide unu, Abụ m Chineke, Chineke unu.
“Muntie, me nkurɔfo, na mɛkasa, medi adanse atia wo, Israel; Mene Onyankopɔn, wo Nyankopɔn no.
8 Anaghị m abara unu mba nʼihi ịchụ aja unu, na aja nsure ọkụ unu nke na-adị m nʼihu oge niile.
Merenka mo anim wɔ mo afɔrebɔde anaa mo hyew afɔre a ɛwɔ mʼanim daa no ho.
9 Enweghị m mkpa maka oke ehi unu site nʼụlọ anụmanụ unu maọbụ mkpi site nʼọgba igwe ewu na atụrụ unu,
Anantwinini a wofi mo mfuw so anaa mpapo a wofi mo buw mu ho nhia me,
10 nʼihi na ụmụ anụmanụ niile nke oke ọhịa bụ nke m, ha na ehi niile nọ nʼelu otu puku ugwu.
efisɛ kwae mu aboa biara yɛ me de, anantwi a wɔwɔ nkoko mpempem so nso saa ara.
11 Amaara m ụmụ nnụnụ niile nọ nʼelu ugwu niile, ihe niile e kere eke nọ nʼọhịa bụ nke m.
Minim anomaa biara a ɔwɔ mmepɔw no so, na wuram abɔde nyinaa yɛ me de.
12 Ọ bụrụ na agụụ agụọ m, agaghị m agwa gị ya, nʼihi na ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke m.
Sɛ ɔkɔm dee me a, anka merenka nkyerɛ mo; efisɛ, wiase ne nea ɛwɔ mu nyinaa yɛ me de.
13 Ana m ata anụ oke ehi, ka ọ bụ ọbara mkpi ka m ga-aṅụ?
Mewe anantwinini nam, na menom mpapo mogya ana?
14 “Chụọrọ Chineke aja ekele, mezuo nkwa i kwere Onye kachasị ihe niile elu,
Momfa aseda afɔre mma Onyankopɔn, na munni bɔ a mohyɛɛ Ɔsorosoroni no so,
15 ma kpọkuo m nʼụbọchị nsogbu gị, aga m agbapụta unu, unu ga-enyekwa m nsọpụrụ.”
na momfrɛ me hiada; na megye mo na moahyɛ me anuonyam.”
16 Ma Chineke na-agwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu sị, “Olee, nkwuwa okwu unu nwere ịgụgharị iwu m, maọbụ kwupụta ọgbụgba ndụ m nʼọnụ unu?
Nanso amumɔyɛfo de, Onyankopɔn bisa wɔn se, “Adɛn nti na moka me mmara na mʼapam da mo ano?
17 Unu kpọrọ ndụmọdụ m asị, na-atụfekwa okwu m nʼazụ unu.
Mukyi me nkyerɛkyerɛ, na motow me nsɛm gu mo akyi.
18 Mgbe unu hụrụ onye ohi, unu na ya na-ejikọta aka; unu na ndị na-akwa iko na-ekekọkwa oke.
Sɛ muhu ɔkorɔmfo a mode mo ho bɔ no; na mo ne nguaman nso bɔ.
19 Ọnụ unu na-eme ọsịịsọ ikwu okwu ọjọọ, okwu aghụghọ na nke rere ure na-esikwa nʼọnụ unu na-asọpụta dịka iyi.
Mode mo ano yɛ bɔne, na mode mo tɛkrɛma boaboa nnaadaa ano.
20 Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile, na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke.
Mokasa tia mo nuabarima bere biara na mosopa mo ankasa na ba.
21 Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị; unu chekwara na adị m ka unu. Ma aga m abara unu mba ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu.
Moayɛ eyinom nyinaa; nanso manka hwee, enti mususuw sɛ mete sɛ mo. Nanso mɛka mo anim, na mede mo sobo asi mo anim.
22 “Tụgharịa uche na nke a, unu ndị na-echefu Chineke, ma ọ bụghị ya, aga m adọrisi unu, ọ dịkwaghị onye ga-agbapụta unu.
“Munnwen eyi ho, mo a mo werɛ fi Onyankopɔn, anyɛ saa a, mɛtetew mo mu nketenkete a obiara remmegye mo;
23 Onye na-eji ekele achụrụ m aja, na-asọpụrụ m, ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya, ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke.”
Nea ɔbɔ aseda afɔre no hyɛ me anuonyam, na osiesie kwan sɛnea mɛda Onyankopɔn nkwagye adi akyerɛ no.” Wɔde ma dwonkyerɛfo.

< Abụ Ọma 50 >