< Abụ Ọma 50 >

1 Abụ Ọma Asaf. Onyenwe anyị, Chineke, Onye kachasị chi niile, ekwuola okwu ma kpọkọta ụwa niile, site na ọwụwa anyanwụ ruo na ọdịda ya.
מזמור לאסף אל אלהים יהוה דבר ויקרא ארץ ממזרח שמש עד מבאו׃
2 Chineke na-enwupụta dịka ìhè, site na Zayọn, nke zuruoke nʼime ịma mma.
מציון מכלל יפי אלהים הופיע׃
3 Chineke anyị na-abịa, ọ gaghị emechikwa ọnụ; ọkụ na-erepịa erepịa dị nʼihu ya, oke ifufe na-efesi ike gbakwara ya gburugburu.
יבא אלהינו ואל יחרש אש לפניו תאכל וסביביו נשערה מאד׃
4 Ọ na-akpọku eluigwe na ụwa ka o kpee ndị ya ikpe: Ọ na-asị,
יקרא אל השמים מעל ואל הארץ לדין עמו׃
5 “Chikọtaranụ m ndị m e doro nsọ, bụ ndị mụ na ha ji ịchụ aja gbaa ndụ.”
אספו לי חסידי כרתי בריתי עלי זבח׃
6 Eluigwe na-ekwupụta ezi omume ya, nʼihi na Chineke nʼonwe ya bụ onye ikpe. (Sela)
ויגידו שמים צדקו כי אלהים שפט הוא סלה׃
7 “Nụrụnụ, ndị m, m ga-ekwukwa, Izrel, aga m agba ama megide unu, Abụ m Chineke, Chineke unu.
שמעה עמי ואדברה ישראל ואעידה בך אלהים אלהיך אנכי׃
8 Anaghị m abara unu mba nʼihi ịchụ aja unu, na aja nsure ọkụ unu nke na-adị m nʼihu oge niile.
לא על זבחיך אוכיחך ועולתיך לנגדי תמיד׃
9 Enweghị m mkpa maka oke ehi unu site nʼụlọ anụmanụ unu maọbụ mkpi site nʼọgba igwe ewu na atụrụ unu,
לא אקח מביתך פר ממכלאתיך עתודים׃
10 nʼihi na ụmụ anụmanụ niile nke oke ọhịa bụ nke m, ha na ehi niile nọ nʼelu otu puku ugwu.
כי לי כל חיתו יער בהמות בהררי אלף׃
11 Amaara m ụmụ nnụnụ niile nọ nʼelu ugwu niile, ihe niile e kere eke nọ nʼọhịa bụ nke m.
ידעתי כל עוף הרים וזיז שדי עמדי׃
12 Ọ bụrụ na agụụ agụọ m, agaghị m agwa gị ya, nʼihi na ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke m.
אם ארעב לא אמר לך כי לי תבל ומלאה׃
13 Ana m ata anụ oke ehi, ka ọ bụ ọbara mkpi ka m ga-aṅụ?
האוכל בשר אבירים ודם עתודים אשתה׃
14 “Chụọrọ Chineke aja ekele, mezuo nkwa i kwere Onye kachasị ihe niile elu,
זבח לאלהים תודה ושלם לעליון נדריך׃
15 ma kpọkuo m nʼụbọchị nsogbu gị, aga m agbapụta unu, unu ga-enyekwa m nsọpụrụ.”
וקראני ביום צרה אחלצך ותכבדני׃
16 Ma Chineke na-agwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu sị, “Olee, nkwuwa okwu unu nwere ịgụgharị iwu m, maọbụ kwupụta ọgbụgba ndụ m nʼọnụ unu?
ולרשע אמר אלהים מה לך לספר חקי ותשא בריתי עלי פיך׃
17 Unu kpọrọ ndụmọdụ m asị, na-atụfekwa okwu m nʼazụ unu.
ואתה שנאת מוסר ותשלך דברי אחריך׃
18 Mgbe unu hụrụ onye ohi, unu na ya na-ejikọta aka; unu na ndị na-akwa iko na-ekekọkwa oke.
אם ראית גנב ותרץ עמו ועם מנאפים חלקך׃
19 Ọnụ unu na-eme ọsịịsọ ikwu okwu ọjọọ, okwu aghụghọ na nke rere ure na-esikwa nʼọnụ unu na-asọpụta dịka iyi.
פיך שלחת ברעה ולשונך תצמיד מרמה׃
20 Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile, na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke.
תשב באחיך תדבר בבן אמך תתן דפי׃
21 Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị; unu chekwara na adị m ka unu. Ma aga m abara unu mba ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu.
אלה עשית והחרשתי דמית היות אהיה כמוך אוכיחך ואערכה לעיניך׃
22 “Tụgharịa uche na nke a, unu ndị na-echefu Chineke, ma ọ bụghị ya, aga m adọrisi unu, ọ dịkwaghị onye ga-agbapụta unu.
בינו נא זאת שכחי אלוה פן אטרף ואין מציל׃
23 Onye na-eji ekele achụrụ m aja, na-asọpụrụ m, ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya, ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke.”
זבח תודה יכבדנני ושם דרך אראנו בישע אלהים׃

< Abụ Ọma 50 >