< Abụ Ọma 5 >
1 Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Ọ bụ opi ka e ji abụ ya. Abụ Ọma nke Devid. Onyenwe anyị, biko, nụrụ ekpere m tulee ịsụ ude m.
Fún adarí orin. Fún ohun èlò orin fífọn. Saamu ti Dafidi. Fi etí sí ọ̀rọ̀ mi, Olúwa, kíyèsi àròyé mi.
2 Geekwa ntị nʼakwa arịrịọ m, gị Chineke onye bụ eze m. Nʼihi na ọ bụ naanị gị ka m na-akpọku.
Fi etí sílẹ̀ sí igbe mi fún ìrànlọ́wọ́, ọba mi àti Ọlọ́run mi, nítorí ìwọ ni mo gba àdúrà sí.
3 Ụtụtụ ụbọchị niile, O Onyenwe anyị, ị ga-anụ olu m; aga m ekwupụtara gị ihe niile na-akpa m mkpa. Aga m elekwa anya ọsịsa gị.
Ní òwúrọ̀, Olúwa, ìwọ yóò gbọ́ ohùn mi; ní òwúrọ̀, èmi yóò gbé ẹ̀bẹ̀ mi sí iwájú rẹ̀ èmi yóò sì dúró ní ìrètí.
4 Ị bụ Chineke, onye ihe ọjọọ ọbụla anaghị atọ ụtọ; gị na ndị ajọ omume apụghị ibikọta.
Nítorí ìwọ kì í ṣe Ọlọ́run tí ó ní inú dídùn sí búburú; bẹ́ẹ̀ ni ẹni ibi kò le è bá ọ gbé.
5 Ndị mpako agaghị eguzo nʼihu gị. Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị.
Àwọn agbéraga kò le è dúró níwájú rẹ̀. Ìwọ kórìíra gbogbo àwọn aṣebi;
6 Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi; Onyenwe anyị kpọrọ ndị ogbu mmadụ niile na ndị aghụghọ niile asị.
ìwọ yóò pa àwọn tí ń ṣe èké run. Apani àti ẹni ẹ̀tàn ènìyàn ni Olúwa yóò kórìíra.
7 Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị, site nʼoke ịhụnanya gị; aga m ejikwa ịtụ egwu kpọọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwuu gị dị.
Ṣùgbọ́n èmi, nípa títóbi àánú rẹ̀, èmi yóò wá sínú ilé rẹ̀; ní tọ̀wọ̀tọ̀wọ̀ ni èmi yóò tẹríba sí ìhà tẹmpili mímọ́ rẹ̀.
8 Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị nʼihi ndị iro m; mee ka ụzọ gị zie ezi nʼihu m.
Tọ́ mi, Olúwa, nínú òdodo rẹ, nítorí àwọn ọ̀tá mi, mú ọ̀nà rẹ tọ́ níwájú mi.
9 Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi, a pụghị ịtụkwasị okwu ọbụla si ha nʼọnụ pụta obi. Akpịrị ha bụ ili ghere oghe; ha ji ire ha ekwu okwu ụgha.
Kò sí ọ̀rọ̀ kan ní ẹnu wọn tí a lè gbàgbọ́; ọkàn wọn kún fún ìparun. Ọ̀nà ọ̀fun wọn ni isà òkú tí ó ṣí sílẹ̀; pẹ̀lú ahọ́n wọn ni wọ́n ń sọ ẹ̀tàn.
10 Maa ha ikpe, Chineke. Mee ka nzube ọjọọ ha niile bụrụ ọdịda ha. Chụpụ ha nʼihi ịba ụba nke ọtụtụ mmehie ha, nʼihi na ha enupula isi megide gị.
Dá wọn lẹ́bi Ọlọ́run! Jẹ́ kí rìkíṣí wọn jẹ́ ìṣubú wọn. Lé wọn jáde nítorí ọ̀pọ̀lọpọ̀ ẹ̀ṣẹ̀ wọn, nítorí wọ́n ti ṣọ̀tẹ̀ sí ọ.
11 Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa; mee ka ha nọgide na-eti mkpu ọṅụ. Were aka nchebe gị kpuchie ha, ka ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ṅụrịa ọṅụ nʼime gị.
Ṣùgbọ́n, jẹ́ kí gbogbo àwọn tí ó sádi ọ́ kí ó yọ̀; jẹ kí wọn máa kọrin fún ayọ̀ títí. Tan ààbò rẹ sórí wọn, àti àwọn tí ó fẹ́ràn orúkọ rẹ yóò máa yọ̀ nínú rẹ.
12 Nʼezie, O Onyenwe anyị, ị na-agọzi onye ezi omume. Ị na-eji ihuọma gị gbaa ha gburugburu dịka ọta.
Dájúdájú, Olúwa, ìwọ bùkún olódodo; ìwọ fi ojúrere rẹ yí wọn ká bí asà.