< Abụ Ọma 5 >

1 Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Ọ bụ opi ka e ji abụ ya. Abụ Ọma nke Devid. Onyenwe anyị, biko, nụrụ ekpere m tulee ịsụ ude m.
For the Chief Musician; with the Nehiloth. A Psalm of David. Give ear to my words, O LORD, consider my (meditation)
2 Geekwa ntị nʼakwa arịrịọ m, gị Chineke onye bụ eze m. Nʼihi na ọ bụ naanị gị ka m na-akpọku.
Hearken unto the voice of my cry, my King, and my God: for unto thee do I pray.
3 Ụtụtụ ụbọchị niile, O Onyenwe anyị, ị ga-anụ olu m; aga m ekwupụtara gị ihe niile na-akpa m mkpa. Aga m elekwa anya ọsịsa gị.
O LORD, in the morning shalt thou hear my voice; in the morning will I order [my prayer] unto thee, and will keep watch.
4 Ị bụ Chineke, onye ihe ọjọọ ọbụla anaghị atọ ụtọ; gị na ndị ajọ omume apụghị ibikọta.
For thou art not a God that hath pleasure in wickedness: evil shall not sojourn with thee.
5 Ndị mpako agaghị eguzo nʼihu gị. Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị.
The arrogant shall not stand in thy sight: thou hatest all workers of iniquity.
6 Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi; Onyenwe anyị kpọrọ ndị ogbu mmadụ niile na ndị aghụghọ niile asị.
Thou shalt destroy them that speak lies: the LORD abhorreth the bloodthirsty and deceitful man.
7 Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị, site nʼoke ịhụnanya gị; aga m ejikwa ịtụ egwu kpọọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwuu gị dị.
But as for me, in the multitude of thy lovingkindness will I come into thy house: in thy fear will I worship toward thy holy temple.
8 Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị nʼihi ndị iro m; mee ka ụzọ gị zie ezi nʼihu m.
Lead me, O LORD, in thy righteousness because of mine enemies; make thy way plain before my face.
9 Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi, a pụghị ịtụkwasị okwu ọbụla si ha nʼọnụ pụta obi. Akpịrị ha bụ ili ghere oghe; ha ji ire ha ekwu okwu ụgha.
For there is no faithfulness in their mouth; their inward part is very wickedness: their throat is an open sepulchre; they flatter with their tongue.
10 Maa ha ikpe, Chineke. Mee ka nzube ọjọọ ha niile bụrụ ọdịda ha. Chụpụ ha nʼihi ịba ụba nke ọtụtụ mmehie ha, nʼihi na ha enupula isi megide gị.
Hold them guilty, O God; let them fall by their own counsels: thrust them out in the multitude of their transgressions; for they have rebelled against thee.
11 Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa; mee ka ha nọgide na-eti mkpu ọṅụ. Were aka nchebe gị kpuchie ha, ka ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ṅụrịa ọṅụ nʼime gị.
But let all those that put their trust in thee rejoice, let them ever shout for joy, because thou defendest them: let them also that love thy name be joyful in thee.
12 Nʼezie, O Onyenwe anyị, ị na-agọzi onye ezi omume. Ị na-eji ihuọma gị gbaa ha gburugburu dịka ọta.
For thou wilt bless the righteous; O LORD, thou wilt compass him with favour as with a shield.

< Abụ Ọma 5 >