< Abụ Ọma 49 >

1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma. Nụrụnụ nke a, unu mmadụ niile! Geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼụwa,
To the Overseer. — By sons of Korah. A Psalm. Hear this, all ye peoples, Give ear, all ye inhabitants of the world.
2 ma ndị dị ala ma ndị dị elu, ma onye ọgaranya ma onye ogbenye.
Both low and high, together rich and needy.
3 Aga m ekwu okwu amamihe, ihe sị nʼobi m ga-enye nghọta.
My mouth speaketh wise things, And the meditations of my heart [are] things of understanding.
4 Aga m aṅa ntị nye ilu, aga m e ji ụbọ akwara kọwaa ilu m.
I incline to a simile mine ear, I open with a harp my riddle:
5 Nʼihi gịnị ka m ga-eji tụọ egwu mgbe ụbọchị ọjọọ bịara, mgbe ndị aghụghọ ọjọọ gbara m gburugburu,
Why do I fear in days of evil? The iniquity of my supplanters doth compass me.
6 ndị na-atụkwasị obi nʼakụnụba ha ma na-anyakwa isi nʼihi oke ụba ha.
Those trusting on their wealth, And in the multitude of their riches, Do shew themselves foolish.
7 O nweghị onye pụrụ ịgbapụta ndụ onye ọzọ, maọbụ nye Chineke ụgwọ e ji agbara onye ahụ,
A brother doth no one at all ransom, He doth not give to God his atonement.
8 nʼihi na ụgwọ e ji agbara ndụ dị oke ọnụ, o nweghị ụgwọ a ga-akwụ nke ga-ezu,
And precious [is] the redemption of their soul, And it hath ceased — to the age.
9 nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ruo ebighị ebi, ma hapụ ịnwụ.
And still he liveth for ever, He seeth not the pit.
10 Nʼihi na mmadụ niile na-ahụ na ndị amamihe na-anwụ, ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche na-anwụkwa, si otu a hapụrụ ndị ọzọ akụnụba ha.
For he seeth wise men die, Together the foolish and brutish perish, And have left to others their wealth.
11 Ili ha na-aghọ ụlọ ha ruo ebighị ebi, ebe obibi ha ruo ọgbọ niile nʼagbanyeghị na ha gụrụ ọtụtụ ala aha ha.
Their heart [is]: Their houses [are] to the age, Their tabernacles to all generations. They proclaimed their names over the lands.
12 Ma mmadụ, nʼagbanyeghị akụnụba ya, aghaghị ịnwụ, dịka anụ ọhịa, ọ ga-anwụkwa.
And man in honour doth not remain, He hath been like the beasts, they have been cut off.
13 Nke a bụ ihe na-adakwasị ndị na-atụkwasị obi nʼonwe ha, na ndị na-eso ụzọ ha, ndị na-akwado okwu ha. (Sela)
This their way [is] folly for them, And their posterity with their sayings are pleased. (Selah)
14 Dịka atụrụ, ọ bụ ala mmụọ ka a kwadooro ha, ọnwụ ga-abụ onye na-azụ ha dịka atụrụ, ma ndị na-eme ihe ziri ezi ga-emeri ha nʼụtụtụ. Ozu ha ga-erekasị nʼime ili nʼebe dị anya site nʼụlọeze ha. (Sheol h7585)
As sheep for Sheol they have set themselves, Death doth afflict them, And the upright rule over them in the morning, And their form [is] for consumption. Sheol [is] a dwelling for him. (Sheol h7585)
15 Ma Chineke ga-agbapụta ndụ m site nʼili, nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya. (Sela) (Sheol h7585)
Only, God doth ransom my soul from the hand of Sheol, For He doth receive me. (Selah) (Sheol h7585)
16 Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba, mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba,
Fear not, when one maketh wealth, When the honour of his house is abundant,
17 nʼihi na ọ ga-agba aka laa ma ọ nwụọ, ịdị ebube ya agaghị eso ya banye nʼili.
For at his death he receiveth nothing, His honour goeth not down after him.
18 Nʼagbanyeghị na ọ gụrụ onwe ya dịka onye a gọziri agọzi mgbe ọ dị ndụ, ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eto gị mgbe ị na-enwe ọganihu,
For his soul in his life he blesseth, (And they praise thee when thou dost well for thyself.)
19 ọ ga-eso ọgbọ ndị nna nna ya ndị na-agaghị ahụkwa ìhè ọzọ.
It cometh to the generation of his fathers, For ever they see not the light.
20 Ndị bara ụba nke na-enweghị nghọta dịka anụ ọhịa nke ga-ala nʼiyi.
Man in honour, who understandest not, Hath been like the beasts, they have been cut off!

< Abụ Ọma 49 >