< Abụ Ọma 48 >

1 Otu Abụ. Abụ Ọma nke ụmụ Kora. Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto, nʼime obodo Chineke anyị, nʼugwu nsọ ya.
Wimbo. Zaburi ya wana wa Kora. Bwana ni mkuu, anayestahili kusifiwa sana, katika mji wa Mungu wetu, mlima wake mtakatifu.
2 Ọ mara mma nʼịdị elu ya, bụkwa ọṅụ elu ụwa niile. Ugwu Zayọn, obodo eze ahụ dị ukwuu, dịka ebe kachasị elu nke Zafọn.
Ni mzuri katika kuinuka kwake juu sana, furaha ya dunia yote. Kama vilele vya juu sana vya Safoni ni Mlima Sayuni, mji wa Mfalme Mkuu.
3 Chineke nọ nʼime ebe ya e wusiri ike; o gosila onwe ya dịka ebe mgbaba ha e wusiri ike.
Mungu yuko katika ngome zake; amejionyesha mwenyewe kuwa ngome yake.
4 Mgbe ndị eze jikọtara ndị agha ha ọnụ, mgbe ha bịakọtara nso,
Wakati wafalme walipounganisha nguvu, waliposonga mbele pamoja,
5 ihe ha hụrụ juru ha anya; nʼihi oke egwu, ha gbara ọsọ.
walimwona nao wakashangaa, wakakimbia kwa hofu.
6 Ahụ ọma jijiji bidoro ha nʼebe ahụ, ihe mgbu ha dịka nke nwanyị na-achọ ịmụ nwa.
Kutetemeka kuliwashika huko, maumivu kama ya mwanamke mwenye utungu wa kuzaa.
7 Ị lara ha nʼiyi dịka oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ si ala ụgbọ mmiri ukwuu nke Tashish nʼiyi.
Uliwaangamiza kama meli za Tarshishi zilizovunjwa na upepo wa mashariki.
8 Dịka anyị nụrụ, otu a ka anyị hụrụ, nʼime obodo Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nʼime obodo Chineke anyị: Chineke na-eme ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. (Sela)
Kama tulivyokuwa tumesikia, ndivyo tulivyoona katika mji wa Bwana Mwenye Nguvu Zote, katika mji wa Mungu wetu: Mungu ataufanya uwe salama milele.
9 O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị, ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ.
Ee Mungu, hekaluni mwako tunatafakari upendo wako usiokoma.
10 O Chineke, dịka aha gị, otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile; aka nri gị jupụtara nʼezi omume.
Ee Mungu, kama jina lako lilivyo, sifa zako zinafika hadi miisho ya dunia, mkono wako wa kuume umejazwa na haki.
11 Ugwu Zayọn na-aṅụrị ọṅụ, obodo nta niile nke Juda nwere obi ụtọ nʼihi ikpe gị niile.
Mlima Sayuni unashangilia, vijiji vya Yuda vinafurahi kwa sababu ya hukumu zako.
12 Gaanụ Zayọn gburugburu, Jegharịa ya gburugburu, gụọkwanụ ụlọ elu ya niile ọnụ.
Tembeeni katika Sayuni, uzungukeni mji, hesabuni minara yake;
13 Lezienụ mgbidi ya niile anya, nyochakwaanụ ebe ya niile e wusiri ike, ka unu nwee ike ịkọrọ ọgbọ na-abịa nʼihu akụkọ ndị a.
yatafakarini vyema maboma yake, angalieni ngome zake, ili mpate kusimulia habari zake kwa kizazi kijacho.
14 Nʼihi na Chineke a, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi, ọ ga-abụ onyendu anyị, ọ bụladị ruo nʼọgwụgwụ.
Kwa kuwa huyu Mungu ni Mungu wetu milele na milele; atakuwa kiongozi wetu hata mwisho.

< Abụ Ọma 48 >