< Abụ Ọma 48 >

1 Otu Abụ. Abụ Ọma nke ụmụ Kora. Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto, nʼime obodo Chineke anyị, nʼugwu nsọ ya.
A Song and Psalm for the sons of Korah. Great is the LORD, and greatly to be praised in the city of our God, in the mountain of his holiness.
2 Ọ mara mma nʼịdị elu ya, bụkwa ọṅụ elu ụwa niile. Ugwu Zayọn, obodo eze ahụ dị ukwuu, dịka ebe kachasị elu nke Zafọn.
Beautiful for situation, the joy of the whole earth, is mount Zion, on the sides of the north, the city of the great King.
3 Chineke nọ nʼime ebe ya e wusiri ike; o gosila onwe ya dịka ebe mgbaba ha e wusiri ike.
God is known in her palaces for a refuge.
4 Mgbe ndị eze jikọtara ndị agha ha ọnụ, mgbe ha bịakọtara nso,
For, lo, the kings were assembled, they passed by together.
5 ihe ha hụrụ juru ha anya; nʼihi oke egwu, ha gbara ọsọ.
They saw it, and so they wondered; they were troubled, and hasted away.
6 Ahụ ọma jijiji bidoro ha nʼebe ahụ, ihe mgbu ha dịka nke nwanyị na-achọ ịmụ nwa.
Fear took hold upon them there, and pain, as of a woman in travail.
7 Ị lara ha nʼiyi dịka oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ si ala ụgbọ mmiri ukwuu nke Tashish nʼiyi.
Thou breakest the ships of Tarshish with an east wind.
8 Dịka anyị nụrụ, otu a ka anyị hụrụ, nʼime obodo Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nʼime obodo Chineke anyị: Chineke na-eme ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. (Sela)
As we have heard, so have we seen in the city of the LORD of hosts, in the city of our God: God will establish it for ever. (Selah)
9 O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị, ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ.
We have thought of thy lovingkindness, O God, in the midst of thy temple.
10 O Chineke, dịka aha gị, otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile; aka nri gị jupụtara nʼezi omume.
According to thy name, O God, so is thy praise to the ends of the earth: thy right hand is full of righteousness.
11 Ugwu Zayọn na-aṅụrị ọṅụ, obodo nta niile nke Juda nwere obi ụtọ nʼihi ikpe gị niile.
Let mount Zion rejoice, let the daughters of Judah be glad, because of thy judgments.
12 Gaanụ Zayọn gburugburu, Jegharịa ya gburugburu, gụọkwanụ ụlọ elu ya niile ọnụ.
Walk about Zion, and go around her: number her towers.
13 Lezienụ mgbidi ya niile anya, nyochakwaanụ ebe ya niile e wusiri ike, ka unu nwee ike ịkọrọ ọgbọ na-abịa nʼihu akụkọ ndị a.
Mark ye well her bulwarks, consider her palaces; that ye may tell it to the generation following.
14 Nʼihi na Chineke a, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi, ọ ga-abụ onyendu anyị, ọ bụladị ruo nʼọgwụgwụ.
For this God is our God for ever and ever: he will be our guide even to death.

< Abụ Ọma 48 >