< Abụ Ọma 47 >
1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma. Kụọnụ aka unu, unu mba niile; jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke.
Pigeni makofi, enyi watu wote; mpigieni Mungu kelele za ushindi.
2 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu. Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile.
Kwa maana Yahwe Aliye Juu anatisha; ni Mfalme mkuu dunia yote.
3 O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị; ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị.
Yeye anawatiisha chini yetu na mataifa chini ya miguu yetu.
4 Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị, ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. (Sela)
Yeye huchagua urithi kwa ajili yetu, utukufu wa Yakobo ambaye alimpenda. Serah
5 Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe. Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo.
Mungu ameinuliwa juu kwa shangwe, Kwa mbiu ya shangwe Yahwe yu juu.
6 Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto; bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.
Mwimbieni Mungu sifa, imbeni sifa; mwimbieni sifa Mfalme wetu, imbeni sifa.
7 Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile. Jirinụ abụ too ya.
Kwa maana Mungu ni Mfalme duniani kote; mwimbieni mkiwa na uelewa.
8 Chineke bụ eze mba niile; ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.
Mungu anatawala mataifa yote; Mungu hukaa kwenye kiti cha enzi.
9 Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala, dịka ndị Chineke nke Ebraham, nʼihi na ndị eze niile dị nʼụwa bụ nke Chineke; ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.
Wakuu wa watu wamekusanyika pamoja kwa watu wa Mungu wa Ibrahimu; kwa kuwa ngao za duniani ni za Mungu; yeye ameinuliwa juu sana.