< Abụ Ọma 47 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma. Kụọnụ aka unu, unu mba niile; jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke.
למנצח לבני קרח מזמור כל העמים תקעו כף הריעו לאלהים בקול רנה׃
2 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu. Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile.
כי יהוה עליון נורא מלך גדול על כל הארץ׃
3 O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị; ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị.
ידבר עמים תחתינו ולאמים תחת רגלינו׃
4 Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị, ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. (Sela)
יבחר לנו את נחלתנו את גאון יעקב אשר אהב סלה׃
5 Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe. Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo.
עלה אלהים בתרועה יהוה בקול שופר׃
6 Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto; bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.
זמרו אלהים זמרו זמרו למלכנו זמרו׃
7 Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile. Jirinụ abụ too ya.
כי מלך כל הארץ אלהים זמרו משכיל׃
8 Chineke bụ eze mba niile; ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.
מלך אלהים על גוים אלהים ישב על כסא קדשו׃
9 Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala, dịka ndị Chineke nke Ebraham, nʼihi na ndị eze niile dị nʼụwa bụ nke Chineke; ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.
נדיבי עמים נאספו עם אלהי אברהם כי לאלהים מגני ארץ מאד נעלה׃

< Abụ Ọma 47 >