< Abụ Ọma 46 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Nʼusoro olu abụ alamot. Otu Abụ. Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị, onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu.
Kwa mtsogoleri wa mayimbidwe. Ndakatulo ya ana a Kora. Nyimbo ya anamwali. Mulungu ndiye kothawira kwathu ndi mphamvu yathu, thandizo lopezekeratu pa nthawi ya mavuto.
2 Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi, maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri.
Nʼchifukwa chake sitidzaopa ngakhale dziko lapansi lisunthike, ngakhale mapiri agwe pakati pa nyanja,
3 Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ, maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. (Sela)
ngakhale madzi ake atakokoma ndi kuchita thovu, ngakhale mapiri agwedezeke ndi kukokoma kwake.
4 Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke, nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu.
Kuli mtsinje umene njira zake za madzi zimasangalatsa mzinda wa Mulungu, malo oyera kumene Wammwambamwamba amakhalako.
5 Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada; Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ.
Mulungu ali mʼkati mwake, iwo sudzagwa; Mulungu adzawuthandiza mmawa.
6 Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa; o welitere olu ya elu, ụwa na-agbaze.
Mitundu ikupokosera, mafumu akugwa; Iye wakweza mawu ake, dziko lapansi likusungunuka.
7 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. (Sela)
Yehova Wamphamvuzonse ali ndi ife, Mulungu wa Yakobo ndi linga lathu.
8 Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere, lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa.
Bwerani kuti mudzaone ntchito za Yehova, chiwonongeko chimene wachibweretsa pa dziko lapansi.
9 Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo nsọtụ nke elu ụwa niile. Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe, ma na-esu ọta agha niile ọkụ.
Iye amathetsa nkhondo ku malekezero a dziko lapansi; Iye amathyola uta ndi kupindapinda mkondo; amatentha zishango ndi moto.
10 Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke! A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile, a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.”
Iye akuti, “Khala chete, ndipo dziwa kuti ndine Mulungu; ndidzakwezedwa pakati pa mitundu ya anthu; ine ndidzakwezedwa mʼdziko lapansi.”
11 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. (Sela)
Yehova Wamphamvuzonse ali ndi ife, Mulungu wa Yakobo ndi linga lathu.

< Abụ Ọma 46 >