< Abụ Ọma 45 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Okoko osisi lili.” Abụ maskil ụmụ Kora. Abụ maka agbamakwụkwọ. Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m, mgbe m na-agụgharị abụ m nye eze; ire m bụ mkpisi akwụkwọ dị nʼaka ọka ode akwụkwọ.
למנצח על-ששנים לבני-קרח משכיל שיר ידידת ב רחש לבי דבר טוב-- אמר אני מעשי למלך לשוני עט סופר מהיר
2 I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ, e ji amara tee egbugbere ọnụ gị mmanụ, ebe ọ bụ na Chineke agọziela gị ruo mgbe ebighị ebi.
יפיפית מבני אדם-- הוצק חן בשפתותיך על-כן ברכך אלהים לעולם
3 Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike; yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe.
חגור-חרבך על-ירך גבור-- הודך והדרך
4 Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri, nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume; ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya.
והדרך צלח רכב-- על-דבר-אמת וענוה-צדק ותורך נוראות ימינך
5 Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze; ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị.
חציך שנונים עמים תחתיך יפלו בלב אויבי המלך
6 O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ
כסאך אלהים עולם ועד שבט מישר שבט מלכותך
7 Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị; ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị, site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.
אהבת צדק ותשנא-רשע על-כן משחך אלהים אלהיך שמן ששון-- מחברך
8 Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ máá na aloos na akashia; ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma. Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ.
מר-ואהלות קציעות כל-בגדתיך מן-היכלי שן מני שמחוך
9 Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ; nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị.
בנות מלכים ביקרותיך נצבה שגל לימינך בכתם אופיר
10 Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu: “Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị.
שמעי-בת וראי והטי אזנך ושכחי עמך ובית אביך
11 Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike. Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.”
ויתאו המלך יפיך כי-הוא אדניך והשתחוי-לו
12 Ada Taịa ga-eji onyinye bịa; ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma.
ובת-צר במנחה פניך יחלו--עשירי עם
13 Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya; ọ bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya.
כל-כבודה בת-מלך פנימה ממשבצות זהב לבושה
14 Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị; ọ bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi mgbe e dubatara ya nʼụlọeze.
לרקמות תובל למלך בתולות אחריה רעותיה--מובאות לך
15 E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha; ha bara nʼime ụlọeze.
תובלנה בשמחת וגיל תבאינה בהיכל מלך
16 Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị; ị ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile.
תחת אבתיך יהיו בניך תשיתמו לשרים בכל-הארץ
17 Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile; nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.
אזכירה שמך בכל-דר ודר על-כן עמים יהודוך לעלם ועד

< Abụ Ọma 45 >