< Abụ Ọma 43 >

1 O Chineke, kpepụta m, kpechitere m ikpe m nʼebe mba na-amaghị Chineke nọ; gbapụta m site nʼaka ndị ajọ omume na ndị aghụghọ.
E te Atua, whakaritea taku whakawa, whakatikaia aku korero ki te iwi atuakore: whakaorangia ahau i te tangata tinihanga e mahi nei i te he.
2 Ị bụ Chineke, ebe m e wusiri ike. Gịnị mere i ji jụ m? Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ, nʼihi mmegbu nke onye iro?
Ko koe hoki te Atua o toku kaha: he aha ahau ka panga nei e koe? He aha ahau ka haere pouri ai i te tukino a te hoariri?
3 Zipụ ìhè gị na eziokwu gị, ka ha duo m; ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị, bụ ebe i bi.
Tukua mai tou marama me tou pono hei arahi i ahau: hei kawe i ahau ki tou maunga tapu, ki ou tapenakara.
4 Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke, gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m. Aga m eji ụbọ akwara too gị, O Chineke, bụ Chineke m.
A ka haere ahau ki te aata a te Atua, ki te Atua, ki toku hari nui: ae, ka whakamoemiti ki a koe, e te Atua, e toku Atua, i runga i te hapa.
5 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ, onye Nzọpụta m na Chineke m.
He aha koe i piko ai, e toku wairua? He aha koe i ohorere ai i roto i ahau? Tumanako ki te Atua: tera ano ahau e whakawhetai ki a ia, ko te ora nei ia o toku mata, ko toku Atua.

< Abụ Ọma 43 >