< Abụ Ọma 42 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Maskil nke ụmụ Kora. Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele, otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke.
TO THE OVERSEER. AN INSTRUCTION OF THE SONS OF KORAH. As a deer pants for streams of water, So my soul pants toward You, O God.
2 Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ. Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke?
My soul thirsted for God, for the living God, When do I enter and see the face of God?
3 Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri nʼehihie ma nʼabalị, mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile, “Olee ebe Chineke gị nọ?”
My tear has been bread day and night to me, In their saying to me all the day, “Where [is] your God?”
4 Ihe ndị a ka m na-echeta mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m: ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga, mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi, na-aga nʼụlọ Chineke.
These I remember, and pour out my soul in me, For I pass over into the shelter, I go softly with them to the house of God, With the voice of singing and confession, The multitude keeping celebration!
5 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya, Onye nzọpụta m na Chineke m.
Why bow yourself, O my soul? Indeed, are you troubled within me? Wait for God, for I still confess Him: The salvation of my countenance—my God!
6 Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m; ya mere, aga m echeta gị site nʼala Jọdan, na ebe dị elu nke Hemon, na sitekwa nʼugwu Miza.
My soul bows itself in me, Therefore I remember You from the land of Jordan, And of the Hermons, from Mount Mizar.
7 Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile; ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile ekpuchiela isi m.
Deep is calling to deep At the noise of Your waterspouts, All Your breakers and Your billows passed over me.
8 Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya, nʼabalị abụ ya dị m nʼobi, ekpere nye Chineke nke ndụ m.
By day YHWH commands His kindness, And by night a song [is] with me, A prayer to the God of my life.
9 Ana m asị Chineke, oke nkume m, “Gịnị mere i ji chefuo m? Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ nʼihi mmegbu nke onye iro?”
I say to God my Rock, “Why have You forgotten me? Why do I go mourning in the oppression of an enemy?”
10 Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu, mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị, ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m, “Olee ebe Chineke gị nọ?”
With a sword in my bones My adversaries have reproached me, In their saying to me all the day, “Where [is] your God?”
11 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ, Onye nzọpụta m na Chineke m.
Why bow yourself, O my soul? And why are you troubled within me? Wait for God, for I still confess Him, The salvation of my countenance, and my God!

< Abụ Ọma 42 >