< Abụ Ọma 41 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ ndị nwere uche na-eleta ndị ogbenye; Onyenwe anyị na-azọpụta ha nʼoge nsogbu.
לַמְנַצֵּחַ מִזְמוֹר לְדָוִֽד׃ אַשְׁרֵי מַשְׂכִּיל אֶל־דָּל בְּיוֹם רָעָה יְֽמַלְּטֵהוּ יְהוָֽה׃
2 Onyenwe anyị ga-echebe ha, debekwa ha ndụ; ọ ga-eme ka ihe na-agara ha nke ọma nʼala ahụ, ọ gaghị arara ha nye nʼọchịchọ ndị iro ha.
יְהוָה ׀ יִשְׁמְרֵהוּ וִֽיחַיֵּהוּ יאשר וְאֻשַּׁר בָּאָרֶץ וְאַֽל־תִּתְּנֵהוּ בְּנֶפֶשׁ אֹיְבָֽיו׃
3 Onyenwe anyị na-elekọta ha mgbe ahụ na-esighị ha ike, meekwa ka ahụ dị ha mma.
יְֽהוָה יִסְעָדֶנּוּ עַל־עֶרֶשׂ דְּוָי כָּל־מִשְׁכָּבוֹ הָפַכְתָּ בְחָלְיֽוֹ׃
4 Ekwuru m sị, “O Onyenwe anyị, meere m ebere; gwọọ m, nʼihi na emehiela m megide gị.”
אֲ‍ֽנִי־אָמַרְתִּי יְהוָה חָנֵּנִי רְפָאָה נַפְשִׁי כִּי־חָטָאתִי לָֽךְ׃
5 Ndị iro m na-esite nʼiro ha ekwu okwu megide m na-asị, “Olee mgbe ọ ga-anwụ ka aha ya laa nʼiyi?”
אוֹיְבַי יֹאמְרוּ רַע לִי מָתַי יָמוּת וְאָבַד שְׁמֽוֹ׃
6 Mgbe otu nʼime ha bịara ịhụ m, ọ na-ekwu okwu ụgha, ma obi ya na-achịkọta ihe nkwulu; mgbe ahụ ọ na-apụ, ga kọsaa ya.
וְאִם־בָּא לִרְאוֹת ׀ שָׁוְא יְדַבֵּר לִבּוֹ יִקְבָּץ־אָוֶן לוֹ יֵצֵא לַחוּץ יְדַבֵּֽר׃
7 Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m; ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha:
יַחַד עָלַי יִתְלַחֲשׁוּ כָּל־שֹׂנְאָי עָלַי ׀ יַחְשְׁבוּ רָעָה לִֽי׃
8 “Ọrịa ọjọọ adakwasịla ya; ọ gaghị esite na ihe ndina ya bilie ọtọ ọzọ.”
דְּֽבַר־בְּלִיַּעַל יָצוּק בּוֹ וַאֲשֶׁר שָׁכַב לֹא־יוֹסִיף לָקֽוּם׃
9 Ọ bụladị ezigbo enyi m, onye m tụkwasịrị obi, onye mụ na ya na-eso erikọ nri m, ebiliela imegide m.
גַּם־אִישׁ שְׁלוֹמִי ׀ אֲשֶׁר־בָּטַחְתִּי בוֹ אוֹכֵל לַחְמִי הִגְדִּיל עָלַי עָקֵֽב׃
10 Ma gị, O Onyenwe anyị, meere m ebere, mee ka ahụ sie m ike ọzọ, ka m nwee ike kwụghachi ha ụgwọ.
וְאַתָּה יְהוָה חָנֵּנִי וַהֲקִימֵנִי וַֽאֲשַׁלְּמָה לָהֶֽם׃
11 Amaara m na ihe banyere m na-atọ gị ụtọ nʼobi, nʼihi na i kwebeghị ka ndị iro m nwee mmeri nʼebe m nọ.
בְּזֹאת יָדַעְתִּי כִּֽי־חָפַצְתָּ בִּי כִּי לֹֽא־יָרִיעַ אֹיְבִי עָלָֽי׃
12 Nʼihi ikwesi ntụkwasị obi m, ị na-akwagide m, mee ka m nọrọ nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi.
וַאֲנִי בְּתֻמִּי תָּמַכְתָּ בִּי וַתַּצִּיבֵנִי לְפָנֶיךָ לְעוֹלָֽם׃
13 Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
בָּרוּךְ יְהוָה ׀ אֱלֹהֵי יִשְׂרָאֵל מֵֽהָעוֹלָם וְעַד הָעוֹלָם אָמֵן ׀ וְאָמֵֽן׃

< Abụ Ọma 41 >