< Abụ Ọma 4 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nke a na-eji ụbọ akwara akpọ. Zaa m mgbe m na-akpọku gị Chineke m, gị onye ezi omume; Napụta m site nʼihe mgbu m, meere m ebere, nụrụkwa ekpere m.
Ngiphendula ekukhaleni kwami, Nkulunkulu wokulunga kwami. Ekucindezelweni wangenzela indawo ebanzi. Woba lomusa kimi, uzwe umkhuleko wami.
2 Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere? Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie? (Sela)
Madodana abantu, koze kube nini liphendula udumo lwami lube lihlazo, lithanda okuyize, lidinga amanga? (Sela)
3 Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya; ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya.
Kodwa yazini ukuthi iNkosi izehlukanisele owesaba uNkulunkulu; iNkosi iyangizwa lapho ngikhala kuyo.
4 Maanụ jijiji, unu emehiekwala; mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu; nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. (Sela)
Thuthumelani, lingoni; khulumani lenhliziyo yenu embhedeni wenu, lithule. (Sela)
5 Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu, chụkwaranụ ya aja ezi omume.
Nikelani imihlatshelo yokulunga, lithembe eNkosini.
6 Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?” Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị.
Banengi abathi: Ngubani ozasitshengisa okuhle? Nkosi, phakamisela ukukhanya kobuso bakho phezu kwethu.
7 Were ọṅụ mejupụta obi m karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu.
Ubeke intokozo enhliziyweni yami okwedlula isikhathi lapho amabele abo lewayini labo elitsha kwandile.
8 Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo, nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị, na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.
Ngizacambalala ngokuthula, khonokho ngilale ubuthongo, ngoba wena Nkosi wedwa uyangihlalisa ngokulondolozeka.

< Abụ Ọma 4 >