< Abụ Ọma 4 >
1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nke a na-eji ụbọ akwara akpọ. Zaa m mgbe m na-akpọku gị Chineke m, gị onye ezi omume; Napụta m site nʼihe mgbu m, meere m ebere, nụrụkwa ekpere m.
詩歌,交與樂官,和以絃樂。 我公義的天主!我一呼求你,你就應允了我,我在困苦中,你曾舒暢了我。求你憐憫我,求你俯聽我禱。
2 Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere? Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie? (Sela)
顯貴的人們,你們的心要硬到幾時?你們愛慕虛幻,追求虛偽究竟為何?
3 Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya; ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya.
你們當知:上主特愛對祂虔敬的人,當我呼求上主的時候,祂一定俯允。
4 Maanụ jijiji, unu emehiekwala; mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu; nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. (Sela)
你們應戰慄,不可一再作惡,在床上檢討,且要捫心思過。
5 Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu, chụkwaranụ ya aja ezi omume.
奉上正義的祭獻,對上主全心依盼。
6 Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?” Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị.
有許多人說:誰能使我們幸福亨通?上主,望你向我們顯你光榮的儀容。
7 Were ọṅụ mejupụta obi m karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu.
你賜給我心中的歡耀,遠勝過麥和酒的豐饒。
8 Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo, nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị, na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.
在平安中我一躺下即刻入睡,上主,唯有有你能使我安居順遂。