< Abụ Ọma 39 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ maka Jedutun. Abụ Ọma Devid. Asịrị m, “Aga m elezi anya nʼụzọ m niile ma debe ire m ka m ghara ikwuhie; aga m eji ihe kechie ọnụ m mgbe m nọ nʼetiti ndị ajọ omume.”
Wuta na buku ya mokambi ya bayembi mpe ya Yedutuni. Nzembo ya Davidi. Namilobelaki: « Nakosala keba na etamboli na ngai mpo ete monoko na ngai esala masumu te; nakobatela penza monoko na ngai tango nyonso moto mabe akozala liboso na ngai. »
2 Ma mgbe m mechiri ọnụ m ma nọrọ duu, jụ ikwu ọ bụladị ihe ọbụla dị mma, oke ihe mgbu m mụbara.
Boye nakangaki monoko na ngai mpe navandaki nye, natikalaki koloba ata likambo moko te; pasi na ngai ebakisamaki makasi.
3 Obi m kporo ọkụ nʼime m, ma mgbe m na-atụgharị ihe ndị a nʼuche, ọkụ ahụ nọ na-ere; mgbe ahụ ekwuru m okwu sị:
Motema na ngai eswaki, moto ezalaki kopela kati na ngai, mpe nalobaki na nzela ya monoko na ngai.
4 “O Onyenwe anyị, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ m na ọnụọgụgụ ụbọchị m niile; mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa.
Yawe, yebisa ngai tango nini bomoi na ngai ekosuka mpe motango ya mikolo ya bomoi na ngai mpo ete nasosola ete bomoi na ngai ezali kaka mpo na mwa tango moke.
5 I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta; ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị. Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuume ọbụladị ndị dịka ha guzosirike. (Sela)
Solo mikolo ya bomoi na ngai ekatama, ezali pamba na miso na Yo. Bomoi ya moto nyonso ezali kaka mopepe.
6 “Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyo nʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ, na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ.
Moto akendaka mpe azongaka, azali kaka lokola elili; amitungisaka kaka pamba, andukaka bomengo, kasi ayebaka te soki nani akotikala na yango.
7 “Ma ugbu a, Onyenwe m, gịnị ka m na-ele anya ya? Olileanya m dị nʼime gị.
Sik’oyo, oh Nkolo, nazela lisusu nini? Natiaka elikya na ngai kati na Yo.
8 Zọpụta m site na mmehie m niile; ekwela ka m bụrụ ihe ọchị nye ndị nzuzu.
Bikisa ngai na mabe na ngai nyonso, kopesa nzela te na bazoba ete bafinga ngai.
9 Agbachiri m nkịtị, ajụrụ m ikwu okwu, nʼihi na ọ bụ gị mere ihe a.
Nakangi monoko, nakoloba lisusu te, pamba te Yo nde osali.
10 Kwụsị iti m ihe; ihe otiti nke aka gị ezuola m ahụ.
Kobeta ngai lisusu te, nazali kokoka lisusu te.
11 Ị na-abara ndị mmadụ mba ma na-ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha; ị na-eripịa akụnụba ha dịka nla, mmadụ ọbụla bụ naanị otu nkuume. (Sela)
Opesaka bato etumbu mpo na masumu na bango mpo na kozongisa bango na nzela; obebisaka biloko na bango ya motuya lokola nselele. Solo, moto nyonso azali kaka mopepe.
12 “O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m, gekwaa ntị nʼakwa m maka enyemaka; emechila ntị gị nye ibe akwa m. Nʼihi ana m ebinyere gị dịka onye ọbịa, dịka onye ije, dịka nna nna m ha mere.
Yawe, yoka libondeli na ngai; yoka na bokebi, wana nazali koganga mpo na kosenga lisungi, kovanda nye te liboso ya mpinzoli na ngai, pamba te epai na Yo, nazali mopaya mpe moleki nzela lokola bakoko na ngai.
13 Lepụ anya na-ebe m nọ, ka m nwee ike kporie ndụ ọzọ, tupu m hapụ ebe a laa, a gaghị ahụkwa m ọzọ.”
Kotala ngai te mpo ete nasepela lisusu, liboso ete nakende na ngai mpe nazala lisusu te.

< Abụ Ọma 39 >