< Abụ Ọma 38 >
1 Abụ Ọma Devid. Arịrịọ. Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe, maọbụ taa m ahụhụ mgbe iwe gị dị ọkụ.
Zabura ta Dawuda. Roƙo ne. Ya Ubangiji, kada ka tsawata mini cikin fushinka ko ka hore ni cikin hasalarka.
2 Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ, aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ.
Gama kibiyoyinka sun soke ni, hannunka kuma ya fāɗo a kaina.
3 Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ; enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m.
Saboda hasalarka babu lafiya a jikina; ƙasusuwana ba lafiya saboda zunubina.
4 Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m.
Laifofina sun mamaye ni kamar nauyin da ya sha ƙarfin ɗauka.
5 Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi nʼihi mmehie enweghị uche m.
Miyakuna sun ruɓe suna kuma wari saboda wawancina na zunubi.
6 Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ.
An tanƙware ni aka kuma ƙasƙantar da ni; dukan yini ina ta kuka.
7 Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu ahụ adịghịkwa m.
Bayana yana fama da zazzaɓi; babu lafiya a jikina.
8 Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa. Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi.
Na gaji sharkaf an kuma ragargaza ni; ina nishi da wahala a cikin zuciyata.
9 O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m; ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ.
Dukan bukatata tana a shimfiɗe a gabanka, ya Ubangiji; ajiyar zuciyata ba ta ɓoyuwa daga gare ka.
10 Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m, ìhè esitekwala nʼanya m pụọ.
Zuciyata na bugu, ƙarfina kuma ya ƙare, har ma haske ya rabu da idanuna.
11 Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m, ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya.
Abokaina da maƙwabtana sun guje ni saboda miyakuna; maƙwabtana ba sa zuwa kusa.
12 Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya, ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m; ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ.
Waɗanda suke neman raina sun sa tarkonsu, waɗanda suke so su cuce ni suna zance lalatar da ni; yini sukutum suna ƙulla mini maƙarƙashiya.
13 Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla, dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya.
Ni kamar kurma ne, wanda ba ya ji, kamar bebe, wanda ba ya iya buɗe bakinsa.
14 Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe, onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu.
Na zama kamar mutumin da ba ya ji, wanda bakinsa ba ya iya ba da amsa.
15 O Onyenwe anyị, ana m eche gị; o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.
Na dogara gare ka, ya Ubangiji; za ka amsa, ya Ubangiji Allahna.
16 Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m; maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.”
Gama na ce, “Kada ka bar su su yi farin ciki a kaina ko su yi kirari a kaina sa’ad da ƙafata ta yi santsi.”
17 Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada. Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu.
Gama ina gab da fāɗuwa, kuma cikin azaba nake kullum.
18 Ana m ekwupụta mmehie m; mmehie m na-ewute m.
Na furta laifina; na damu da zunubina.
19 Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ, ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba.
Da yawa ne masu gāba da ni da ƙarfi; waɗanda suke kina ba dalili sun yi yawa.
20 Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe, na-ebo ebubo megide m nʼagbanyeghị na m na-achọ ime naanị ezi ihe.
Waɗanda suke sāka alherina da mugunta, suna cin zarafina sa’ad da nake bin abin da yake daidai.
21 O Onyenwe anyị, ahapụkwala m; O Chineke m, anọkwala m ebe dị anya.
Ya Ubangiji, kada ka yashe ni; kada ka yi nesa da ni, ya Allahna.
22 Bịa ọsịịsọ inyere m aka Onyenwe m na Onye nzọpụta m.
Zo da sauri ka taimake ni, Ya Ubangiji Mai Cetona.