< Abụ Ọma 37 >

1 Abụ Ọma Devid. Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ, maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo;
Ungazikhathazi ngababi, ungabi lomhawu ngabenzi bobubi.
2 nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa, dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa.
Ngoba bazaqunywa masinyane njengotshani, babune njengohlaza.
3 Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ.
Themba eNkosini, wenze okuhle, uhlale elizweni, uzondle ngothembeko.
4 Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.
Zithokozise eNkosini, njalo izakunika iziloyiso zenhliziyo yakho.
5 Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:
Nikela indlela yakho eNkosini, uthembe kuyo; yona izakwenza.
6 Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ, meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie.
Izaveza ukulunga kwakho njengokukhanya, lelungelo lakho njengemini enkulu.
7 Dere duu nʼihu Onyenwe anyị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.
Thula eNkosini, uyilindele; ungazikhathazi ngophumelelayo ngendlela yakhe, ngomuntu owenza amacebo amabi.
8 Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ.
Yekela intukuthelo, utshiye ulaka; ungazikhathazi langokwenza okubi.
9 Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi, ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.
Ngoba ababi bazaqunywa, kodwa labo abalindele iNkosi bona bazakudla ilifa lelizwe.
10 Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga; ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha.
Kuseyisikhatshana nje, omubi angabe esaba khona; loba uhlola indawo yakhe uyabe engasekho.
11 Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha, ha ga-enwekwa udo dị ukwuu.
Kodwa abamnene bazakudla ilifa lelizwe, bazithokozise ngobunengi bokuthula.
12 Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume, na-ata ikekere eze megide ha;
Omubi uyaceba emelene lolungileyo, amgedlele amazinyo akhe.
13 ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị, nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa.
INkosi izamhleka, ngoba iyabona ukuthi usuku lwakhe luyeza.
14 Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha, kwee ụta ha ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa, igbu ndị ụzọ ha ziri ezi.
Ababi sebehwatshe inkemba, bagobise idandili labo, ukumlahla phansi umyanga loswelayo, ukubulala abaqotho ngendlela.
15 Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha, kụrisiekwa ụta ha.
Inkemba yabo izangena kweyabo inhliziyo, kwephulwe amadandili abo.
16 Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume;
Okuncinyane alakho olungileyo kungcono kulenotho yababi abanengi.
17 nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume, ma Onyenwe anyị ga-akwagide ndị ezi omume.
Ngoba ingalo zababi zizakwephulwa, kodwa iNkosi iyabasekela abalungileyo.
18 Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị, ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
INkosi iyazazi izinsuku zabaqotho, lelifa labo lizakuba sephakadeni.
19 Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ; ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ.
Kabayikuyangeka ngesikhathi esibi, langensuku zendlala bazasutha.
20 Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi. Nʼagbanyeghị na ndị iro Onyenwe anyị dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ, ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ.
Kodwa ababi bazabhubha; lezitha zeNkosi zizanyamalala njengamafutha amawundlu, zinyamalale entuthwini.
21 Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya, ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere.
Omubi uyeboleka, angabuyiseli, kodwa olungileyo uyahawukela, aphe.
22 Ndị Onyenwe anyị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa, ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ.
Ngoba ababusiswe yiyo bazakudla ilifa lelizwe, kodwa abaqalekiswe yiyo bazaqunywa.
23 Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike;
Izinyathelo zomuntu olungileyo ziqondiswa yiNkosi, iyathokoza endleleni yakhe.
24 ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya.
Loba esiwa, kayikulahlwa phansi, ngoba iNkosi isekela isandla sakhe.
25 Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.
Ngangimutsha, sengimdala, kanti kangibonanga olungileyo etshiyiwe, lenzalo yakhe idinga ukudla.
26 Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe, ụmụ ha ga-abụ ngọzị.
Usuku lonke ulomusa, uyeboleka, lenzalo yakhe iyisibusiso.
27 Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe, mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi.
Suka ebubini, wenze okuhle; uhlale kuze kube nininini.
28 Onyenwe anyị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya. Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi, ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ;
Ngoba iNkosi ithanda isahlulelo, kayiyikubatshiya abangcwele bayo. Bazalondolozwa kuze kube nininini; kodwa inzalo yababi izaqunywa.
29 ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha, ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi.
Abalungileyo bazakudla ilifa lelizwe, bahlale kulo kuze kube nininini.
30 Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta, ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi.
Umlomo wolungileyo ukhuluma inhlakanipho, lolimi lwakhe lukhuluma isahlulelo.
31 Iwu Chineke ya dị ya nʼobi; nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ.
Umlayo kaNkulunkulu wakhe usenhliziyweni yakhe; izinyathelo zakhe kazitsheleli.
32 Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo, na-achọ ịnapụ ha ndụ ha;
Omubi uyamqaphela olungileyo, udinga ukumbulala.
33 ma Onyenwe anyị agaghị ahapụ ha nʼaka ha, ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe.
INkosi kayiyikumyekela esandleni sakhe, kayiyikumlahla lapho esahlulelwa.
34 Chere Onyenwe anyị, debekwa ụzọ ya. Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa; mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya.
Lindela eNkosini, ugcine indlela yayo, izakuphakamisa ukuthi udle ilifa lelizwe; uzabona lapho ababi bequnywa.
35 Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike, ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala,
Ngambona omubi elamandla amakhulu, eziqhelisa njengesihlahla semvelo esiluhlaza.
36 ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ, nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya.
Kube kanti wedlula, khangela-ke, wayengasekho; yebo ngamdinga, kodwa katholakalanga.
37 Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama; ọganihu dịịrị onye udo.
Nanzelela opheleleyo, umbone oqotho, ngoba ukuphela kwalowomuntu kuyikuthula.
38 Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi; ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ajọ omume.
Kodwa abaphambukayo bazabhujiswa kanyekanye; ukuphela kwababi kuzaqunywa.
39 Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa; ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu.
Kodwa usindiso lwabalungileyo luvela eNkosini, inqaba yabo esikhathini sokuhlupheka.
40 Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume, nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.
Njalo iNkosi izabasiza ibakhulule; izabakhulula kwababi, ibasindise, ngoba baphephela kuyo.

< Abụ Ọma 37 >