< Abụ Ọma 37 >
1 Abụ Ọma Devid. Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ, maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo;
Af David. Lad din Vrede ikke optændes imod de onde; vær ikke nidkær imod dem, som gøre Uret;
2 nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa, dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa.
thi de skulle hastelig falme som Græs, og visne som grønne Urter.
3 Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ.
Forlad dig paa Herren og gør godt; bo i Landet og nær dig trolig;
4 Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.
og forlyst dig i Herren, saa skal han give dig dit Hjertes Begæring.
5 Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:
Vælt din Vej paa Herren og forlad dig paa ham, han skal gøre det.
6 Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ, meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie.
Og han skal føre din Retfærdighed frem som Lyset og din Ret som Middagsglansen.
7 Dere duu nʼihu Onyenwe anyị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.
Ti for Herren og forvent ham; lad din Vrede ikke optændes imod den Mand, hvis Vej lykkes, imod den Mand, som øver Underfundighed.
8 Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ.
Lad af fra Vrede og lad Heftighed fare, lad din Vrede ikke optændes, den er kun til at gøre ondt.
9 Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi, ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.
Thi de onde skulle udryddes, men de, som bie efter Herren, de skulle arve Landet.
10 Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga; ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha.
Og endnu et lidet, saa er den ugudelige ikke mere; og naar du giver Agt paa hans Sted, da er han borte.
11 Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha, ha ga-enwekwa udo dị ukwuu.
Men de sagtmodige skulle arve Landet og forlyste sig over stor Fred.
12 Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume, na-ata ikekere eze megide ha;
Den ugudelige optænker Skalkhed imod den retfærdige og skærer Tænder imod ham.
13 ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị, nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa.
Herren skal le ad ham; thi han ser, at hans Dag er kommen.
14 Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha, kwee ụta ha ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa, igbu ndị ụzọ ha ziri ezi.
De ugudelige have uddraget Sværd og spændt deres Bue at fælde en elendig og fattig, at tage Livet af dem, som vandre i Oprigtighed.
15 Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha, kụrisiekwa ụta ha.
Deres Sværd skal komme i deres eget Hjerte, og deres Buer skulle sønderbrydes.
16 Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume;
Det lidet, som den retfærdige har, er bedre end mange ugudeliges Gods.
17 nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume, ma Onyenwe anyị ga-akwagide ndị ezi omume.
Thi de ugudeliges Arme skulle sønderbrydes; men Herren opholder de retfærdige.
18 Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị, ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Herren kender de retsindiges Dage, og deres Arv skal blive evindelig.
19 Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ; ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ.
De skulle ikke beskæmmes i den onde Tid, og de skulle mættes i Hungers Dage.
20 Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi. Nʼagbanyeghị na ndị iro Onyenwe anyị dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ, ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ.
Thi de ugudelige skulle omkomme, ja, Herrens Fjender, som Engenes Pragt; de ere forsvundne, i Røg forsvundne.
21 Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya, ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere.
En ugudelig maa tage til Laans, og kan ikke betale; men en retfærdig kan forbarme sig og giver.
22 Ndị Onyenwe anyị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa, ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ.
Thi Herrens velsignede skulle arve Landet; men hans forbandede skulle udryddes.
23 Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike;
Af Herren stadfæstes en Mands Gang, og han vil have Velbehag til hans Vej.
24 ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya.
Naar han falder, bliver han ikke liggende; thi Herren holder fast ved hans Haand.
25 Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.
Jeg har været ung og er bleven gammel; men jeg har ikke set en retfærdig forladt eller hans Sæd at søge efter Brødet.
26 Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe, ụmụ ha ga-abụ ngọzị.
Han forbarmer sig den ganske Dag og laaner ud, og hans Sæd skal blive til en Velsignelse.
27 Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe, mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi.
Vig fra ondt, og gør godt, saa skal du blive boende evindelig.
28 Onyenwe anyị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya. Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi, ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ;
Thi Herren elsker Ret og forlader ikke sine hellige, de ere bevarede evindelig; men de ugudeliges Sæd er udryddet.
29 ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha, ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi.
De retfærdige skulle arve Landet og bo der evindelig.
30 Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta, ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi.
En retfærdigs Mund skal tale Visdom, og hans Tunge skal forkynde Ret.
31 Iwu Chineke ya dị ya nʼobi; nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ.
Hans Guds Lov er i hans Hjerte; hans Trin skulle ikke glide.
32 Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo, na-achọ ịnapụ ha ndụ ha;
En ugudelig lurer paa den retfærdige og søger efter at dræbe ham.
33 ma Onyenwe anyị agaghị ahapụ ha nʼaka ha, ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe.
Herren skal ikke overlade ham i hans Haand og ej kende ham skyldig, naar han dømmes.
34 Chere Onyenwe anyị, debekwa ụzọ ya. Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa; mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya.
Bi efter Herren og var paa hans Vej, saa skal han ophøje dig til at arve Landet; du skal se paa de ugudeliges Udryddelse.
35 Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike, ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala,
Jeg saa en ugudelig, en Voldsmand; han udbredte sig som et grønt Rodskud.
36 ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ, nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya.
Men han forsvandt og se, han var ikke mere; og jeg søgte efter ham, men han fandtes ikke.
37 Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama; ọganihu dịịrị onye udo.
Tag Vare paa den retsindige, og se hen til den oprigtige, thi Fredens Mand har en Fremtid.
38 Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi; ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ajọ omume.
Men Overtrædere skulle ødelægges til Hobe; de ugudeliges Fremtid er borte.
39 Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa; ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu.
Men de retfærdiges Frelse er af Herren, han er deres Styrke i Nødens Tid.
40 Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume, nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.
Og Herren skal hjælpe dem og udfri dem; han skal udfri dem fra de ugudelige og frelse dem; thi de have forladt sig paa ham.