< Abụ Ọma 36 >

1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid, bụ ohu Onyenwe anyị. E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chineke banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe: Ọ dịghị ịtụ egwu Chineke dị nʼanya ha.
Kwa mtsogoleri wa mayimbidwe. Salimo la Davide, mtumiki wa Yehova. Uthenga uli mu mtima mwanga wonena za kuchimwa kwa munthu woyipa: Mu mtima mwake mulibe kuopa Mulungu.
2 Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha, na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị.
Pakuti iye mʼkuona kwake amadzinyenga yekha kwambiri, sazindikira kapena kudana ndi tchimo lake.
3 Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ; ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma.
Mawu a pakamwa pake ndi oyipa ndi achinyengo; iyeyo waleka kukhala wanzeru ndi kuchita zabwino.
4 Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe; ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume, ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi.
Ngakhale ali pa bedi pake amakonzekera zoyipa; iye amadzipereka yekha ku njira ya uchimo ndipo sakana cholakwa chilichonse.
5 O Onyenwe anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe, ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe.
Chikondi chanu Yehova, chimafika ku mayiko a kumwamba, kukhulupirika kwanu mpaka ku mitambo.
6 Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu, ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri. O Onyenwe anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ.
Chilungamo chanu Mulungu chili ngati mapiri aakulu, chiweruzo chanu chili ngati kuzama kwakukulu. Yehova mumasunga munthu pamodzi ndi chinyama.
7 Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke! Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ.
Chikondi chanu chosatha ndi chamtengowapatali! Otchuka pamodzi ndi anthu wamba pakati pa anthu amapeza pothawirapo mu mthunzi wa mapiko anu.
8 Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị; Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị.
Iwo amadyerera zinthu zambiri za mʼnyumba yanu; Inu mumawapatsa chakumwa kuchokera mu mtsinje wanu wachikondwerero.
9 Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị; ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.
Pakuti kwa Inu kuli kasupe wamoyo; mʼkuwala kwanu ifenso timaona kuwala.
10 Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị, ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi.
Pitirizani chikondi chanu pa iwo amene amakudziwani, chilungamo chanu kwa olungama mtima.
11 Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi, ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo.
Musalole kuti phazi la wodzikuza libwere kulimbana nane, kapena dzanja la oyipa kundithamangitsa.
12 Lee ka ndị na-eme ajọ ihe si daa nʼala, a kwatuola ha nʼala, ha apụghịkwa ibilite ọzọ.
Onani momwe ochita zoyipa agonera atagwa, aponyeni pansi, kuti asathe kudzukanso!

< Abụ Ọma 36 >