< Abụ Ọma 35 >

1 Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, lụso ha ọgụ bụ ndị na-alụso m ọgụ; buso ha agha bụ ndị na-ebuso m agha.
Ipsi David. Iudica Domine nocentes me, expugna impugnantes me.
2 Yikwasị uwe agha gị, werekwa ọta gị; bilie bịa nyere m aka.
Apprehende arma et scutum: et exurge in adiutorium mihi.
3 Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị; bịa zute ndị na-achụ m ọsọ. Gwa mkpụrụobi m, “Abụ m nzọpụta gị.”
Effunde frameam, et conclude adversus eos, qui persequuntur me: dic animæ meæ: Salus tua ego sum.
4 Mee ka ihere mee ndị niile na-agbalịsị ike igbu m. Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ, na ndị ihere mere.
Confundantur et revereantur, quærentes animam meam. Avertantur retrorsum, et confundantur cogitantes mihi mala.
5 Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe, ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụfu ha.
Fiant tamquam pulvis ante faciem venti: et angelus Domini coarctans eos.
6 Mee ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, bụrụkwa ebe na-amị amị; ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụ ha ọsọ.
Fiat via illorum tenebræ et lubricum: et angelus Domini persequens eos.
7 Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ha, ma ha siere m ọnya, gwukwaara m olulu nʼụzọ m.
Quoniam gratis absconderunt mihi interitum laquei sui: supervacue exprobraverunt animam meam.
8 Ka mbibi bịakwasị ha na mberede, ka ụgbụ ha zobeere m kee ha; ka ha lakwaa nʼiyi site nʼidaba nʼolulu ahụ ha gwuru.
Veniat illi laqueus, quem ignorat: et captio, quam abscondit, apprehendat eum: et in laqueum cadat in ipsum.
9 Mgbe ahụ, mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ na Onyenwe anyị, ọ ga-enwekwa obi ụtọ nʼime nzọpụta ya.
Anima autem mea exultabit in Domino: et delectabitur super salutari suo.
10 Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị, “O Onyenwe anyị, ọ bụ onye dịka gị? Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha, ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.”
Omnia ossa mea dicent: Domine, quis similis tibi? Eripiens inopem de manu fortiorum eius: egenum et pauperem a diripientibus eum.
11 Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m; ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ.
Surgentes testes iniqui, quæ ignorabam interrogabant me.
12 Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ. Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ.
Retribuebant mihi mala pro bonis: sterilitatem animæ meæ.
13 Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe, site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala. Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa,
Ego autem cum mihi molesti essent, induebar cilicio. Humiliabam in ieiunio animam meam: et oratio mea in sinu meo convertetur.
14 ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m, jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ.
Quasi proximum, et quasi fratrem nostrum, sic complacebam: quasi lugens et contristatus sic humiliabar.
15 Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ; mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m. Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka.
Et adversum me lætati sunt, et convenerunt: congregata sunt super me flagella, et ignoravi.
16 Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe, na-atakwara m ikikere eze ha.
Dissipati sunt, nec compuncti, tentaverunt me, subsannaverunt me subsannatione: frenduerunt super me dentibus suis.
17 O Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme? Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile, site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa.
Domine quando respicies? restitue animam meam a malignitate eorum, a leonibus unicam meam.
18 Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu, nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị.
Confitebor tibi in Ecclesia magna, in populo gravi laudabo te.
19 Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m, mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị; ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro, mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike.
Non supergaudeant mihi qui adversantur mihi inique: qui oderunt me gratis et annuunt oculis.
20 Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu, kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ.
Quoniam mihi quidem pacifice loquebantur: et in iracundia terræ loquentes, dolos cogitabant.
21 Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị, “Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.”
Et dilataverunt super me os suum: dixerunt: Euge, euge, viderunt oculi nostri.
22 O Onyenwe anyị, ị hụla nke a, agbakwala nkịtị; anọkwala m nʼebe dị anya, O Onyenwe anyị.
Vidisti Domine, ne sileas: Domine ne discedas a me.
23 Teta, bilie bụụrụ m onye mkpepụta m. Kpechitere m ọnụ m, Chineke m na onyenwe m.
Exurge et intende iudicio meo: Deus meus, et Dominus meus in causam meam.
24 O Onyenwe anyị Chineke m, kpepụta m nʼihi ezi omume gị; ekwekwala ka ha chịa m ọchị.
Iudica me secundum iustitiam tuam Domine Deus meus, et non supergaudeant mihi.
25 Ekwekwala ka ha sị, “Ahaa, ọ dị ka anyị tụrụ anya ya!” Maọbụ sị, “Anyị eloola ya!”
Non dicant in cordibus suis: Euge, euge, animæ nostræ: nec dicant: Devoravimus eum.
26 Mee ka ihere na ọgbaaghara bụrụ nke ndị na-achị m ọchị nʼime mkpagbu m; were ihere na nweda nʼala yinye ha dịka uwe, bụ ndị niile na-ebuli onwe ha elu imegide m.
Erubescant et revereantur simul, qui gratulantur malis meis. Induantur confusione et reverentia qui magna loquuntur super me.
27 Ka ndị niile mkpepụta m dị mma were obi ụtọ tie mkpu ọṅụ; ka ha na-asị mgbe niile, “Ka e bulie Onyenwe anyị elu, onye ọdịmma nke ohu ya na-amasị.”
Exultent et lætentur qui volunt iustitiam meam: et dicant semper: Magnificetur Dominus, qui volunt pacem servi eius.
28 Ire m ga-ekwu banyere ezi omume gị na otuto gị niile ogologo ụbọchị niile.
Et lingua mea meditabitur iustitiam tuam, tota die laudem tuam.

< Abụ Ọma 35 >