< Abụ Ọma 34 >
1 Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m.
E HOOMAIKAI aku au ia Iehova i na manawa a pau; E mau ana i kuu waha ka hoolea nona.
2 Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ.
E hauoli kuu uhane ia Iehova; E lohe mai ka poe hoohaahaa a e olioli no hoi.
3 Soro m too Onyenwe anyị; ka anyị bulie aha ya elu.
E hoonui hoi oukou ia Iehova me au nei, A e hapai pu kakou i kona inoa.
4 Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile.
Ua imi aku au ia Iehova a ua hoolohe mai ia ia'u; Ua hoopakele mai oia ia'u i ka'u mau mea e makau ai a pau.
5 Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha.
Nana aku la lakou ia ia a malamalama iho la lakou; Aole hilahila ko lakou mau maka.
6 Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile.
Kahea aku la keia kanaka ilihune, A hoolohe mai la o Iehova ia ia, A hoopakele oia i kona popilikia a pau.
7 Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha.
Hoomoana mai ka anela o Iehova a puni ka poe weliweli ia ia, A ua hoopakele hoi ia lakou.
8 Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.
E hoao oukou a e ike hoi he maikai no Iehova; Pomaikai ke kanaka i paulele ia ia.
9 Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya, nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya.
E weliweli aku ia Iehova, e ka poe haipule a pau; No ka mea, aole e nele ka poe weliweli ia ia.
10 Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị.
Ua nele a ua pololi na liona opiopio; Aka, o ka poe imi ia Iehova, aole e nele i ka mea maikai.
11 Ụmụ m, bịanụ gee m ntị; aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ.
E hele mai, e na kamalii, e hoolohe mai ia'u; A e ao aku au ia oukou i ka weliweli ia Iehova:
12 Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya, ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,
Owai ke kanaka i makemake i ke ola, I makemake hoi i na la he nui i ike ai oia i ka maikai?
13 chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ, chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha.
E kaohi i kou alelo mai ka hewa, A me kou mau lehelehe i ole e olelo ino.
14 Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe, chọọ udo ma gbasookwa ya.
E haalele i ka hewa a e haua ma ka pono; E imi i ka maluhia, a malaila e hahai ai.
15 Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha;
Kau pono na maka o Iehova i ka poe pono, A me kona mau pepeiao i ko lakou kahea ana.
16 ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa.
Ku e ka maka o Iehova i ka poe hewa, E hoonalo loa ia lakou mai ka honua aku.
17 Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.
Kahea na mea pono, a hoolohe mai no hoi o Iehova; A hoakea mai no oia ia lakou i ko lakou popilikia a pau.
18 Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.
Kokoke mai no o Iehova i ka poe naau palupalu; A hoola no hoi oia i na mea uhane mihi.
19 Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.
He nui no ka pilikia ana o ka mea pono: A hoakea mai no hoi o Iehova ia ia, mai ia mea a pau.
20 Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie.
Malama no hoi oia i kona mau iwi, Aohe mea o lakou i haki.
21 Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ; ndị na-akpọ onye ezi omume asị ka a ga-ama ikpe ọnwụ.
E hoomake no ka hewa i ke kanaka aia; A e hoopaiia ka poe inaina i ka poe pono.
22 Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya; ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.
Hoola o Iehova i ka uhane o kana poe kauwa: Aohe mea paulele ia ia o lilo i ka hoopaiia.