< Abụ Ọma 34 >

1 Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m.
Of David, when he feigned madness in the presence of Abimelech, who drove him away, and he left. I will bless the Lord at all times, in my mouth will his praise be forever.
2 Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ.
In the Lord will my heart make her boast, the humble will hear and be glad.
3 Soro m too Onyenwe anyị; ka anyị bulie aha ya elu.
O magnify the Lord with me and let us extol his name together.
4 Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile.
I sought the Lord, and, in answer, he saved me from all my terrors.
5 Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha.
Look to him and you will be radiant, with faces unashamed.
6 Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile.
Here is one who was crushed, but cried and was heard by the Lord, and brought safe out of every trouble.
7 Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha.
The Lord’s angel encamps about those who fear him, and rescues them.
8 Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.
O taste and see that the Lord is good, happy those who take refuge in him.
9 Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya, nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya.
Fear the Lord, all his people, for they who fear him lack nothing.
10 Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị.
Even young lions may be poor and hungry, but those who seek the Lord will not lack any good thing.
11 Ụmụ m, bịanụ gee m ntị; aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ.
Come, children, listen to me. I will teach you the fear of the Lord.
12 Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya, ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,
Which of you is desirous of life, loves many and happy days?
13 chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ, chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha.
Then guard your tongue from evil, and your lips from speaking deceit.
14 Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe, chọọ udo ma gbasookwa ya.
Depart from evil, and do good; seek peace, and pursue it.
15 Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha;
The eyes of the Lord are towards the righteous, his ears are towards their cry for help.
16 ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa.
The Lord sets his face against those who do evil, to root their memory out of the earth.
17 Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.
When righteous cry, they are heard by the Lord, and he saves them from all their distresses.
18 Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.
The Lord is near to the broken-hearted, he helps those whose spirit is crushed.
19 Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.
Many misfortunes befall the righteous, but the Lord delivers them out of them all.
20 Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie.
He guards all their bones, none are broken.
21 Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ; ndị na-akpọ onye ezi omume asị ka a ga-ama ikpe ọnwụ.
Misfortune will slay the ungodly; those who hate the righteous are doomed.
22 Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya; ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.
The Lord ransoms the life of his servants, and none will be doomed who takes refuge in him.

< Abụ Ọma 34 >