< Abụ Ọma 31 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m; site nʼezi omume gị gbapụta m.
Don mai bi da kaɗe-kaɗe. Zabura ta Dawuda. A gare ka, ya Ubangiji, na nemi mafaka; kada ka bari in taɓa shan kunya; ka cece ni cikin rahamarka.
2 Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m, bịa ngwangwa gbapụta m; ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m.
Ka juye kunnenka gare ni, ka zo da sauri ka cece ni; ka zama dutsen mafakata, mafaka mai ƙarfi na cetona.
3 Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike, nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m.
Da yake kai ne dutsena da kuma kagarata, saboda sunanka ka bi da ni ka kuma jagorance ni.
4 Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m, nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike.
Ka’yantar da ni daga tarkon da aka sa mini, gama kai ne mafakata.
5 Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m; gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu.
Cikin hannuwanka na miƙa ruhuna; ka cece ni, ya Ubangiji Allah na gaskiya.
6 Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru; ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi m.
Na ƙi waɗanda suke manne wa gumakan banza; na dogara ga Ubangiji.
7 Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị, nʼihi na ị hụrụ nsogbu m marakwa ihe mgbu nke mmụọ m.
Zan yi murna in kuma yi farin ciki a cikin ƙaunarka, gama ka ga azabata ka kuma san wahalar raina.
8 I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m, kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ.
Ba ka ba da ni ga abokin gāba ba amma ka sa ƙafafuna a wuri mai sarari.
9 O Onyenwe anyị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m. Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa; ike adịghịkwa m.
Ka yi mini jinƙai, ya Ubangiji, gama ina cikin damuwa; idanuna sun gaji da baƙin ciki, raina da jikina sun tafke tilis.
10 Iru ụjụ eriela m ahụ; ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m; ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa m ruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m.
Baƙin ciki ya rufe raina shekaruna sun cika da nishi; ƙarfina ya karai saboda azaba, ƙasusuwana kuma sun gaji tiƙis.
11 Nʼihi ndị iro m niile; ndị agbataobi m na-elelị m anya. Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m, ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee.
Saboda dukan abokan gābana, Na zama tamƙar abin reni na maƙwabtana; na zama abin tsoro ga abokaina, waɗanda suka gan ni a titi sukan gudu daga gare ni.
12 Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ. A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m.
An manta da ni sai ka ce na mutu; na zama kamar fasasshen kasko.
13 Anụla m nkwulu ha megide m; oke egwu dị nʼakụkụ niile; ha na-agba izu megide m, na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m.
Gama nakan ji raɗe-raɗen mutane masu yawa; akwai tsoro a kowane gefe; suna ƙulla maƙarƙashiya a kaina suna shirya su ɗauke raina.
14 Ma ana m atụkwasị gị obi Onyenwe anyị. Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.”
Amma na dogara gare ka, ya Ubangiji; na ce, “Kai ne Allahna.”
15 Oge m niile dị gị nʼaka. Napụta m nʼaka ndị iro m na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ.
Lokutana suna a hannuwanka; ka cece ni daga abokan gābana da kuma daga waɗanda suke fafara ta.
16 Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ; zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ.
Bari fuskarka ta haskaka a kan bawanka; ka cece ni da ƙaunarka marar ƙarewa.
17 O Onyenwe anyị, ekwela ka ihere mee m, nʼihi na akpọkuola m gị; kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ, ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu. (Sheol h7585)
Kada ka bari in sha kunya, ya Ubangiji, gama na yi kuka gare ka; amma bari mugaye su sha kunya su kuma kwanta shiru a cikin kabari. (Sheol h7585)
18 Ka ọnụ ahụ ha ji ekwu okwu ụgha mechie kpamkpam; nʼihi na ọ bụ site na mpako na nlelị ka ha ji na-ekwu okwu megide ndị ezi omume.
Bari a rufe leɓunan ƙarairayinsu, gama da fariya da reni suna magana da girman kai a kan adalai.
19 Lee ka ịdị mma gị si baa ụba, nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị, nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị, nʼihu ọha mmadụ.
Alherinka da girma yake, wanda ka ajiye domin waɗanda suke tsoronka, wanda ka mayar a gaban mutane a kan waɗanda suke neman mafaka daga gare ka.
20 I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ; ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị; ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche.
Cikin inuwar kasancewarka ka ɓoye su daga makircin mutane; a wurin zamanka ka kiyaye su lafiya daga harsuna masu zagi.
21 Otuto dịrị Onyenwe anyị nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu.
Yabo ya tabbata ga Ubangiji, gama ya nuna ƙaunarsa mai banmamaki gare ni sa’ad da aka yi mini kwanto kewaye da birni.
22 Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị, “Ewezugala m site nʼihu ya!” Ma ị nụrụ arịrịọ m maka ebere mgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka.
Cikin tsorona na ce, “An yanke ni daga gabanka!” Duk da haka ka ji kukata na neman jinƙai sa’ad da na kira gare ka don taimako.
23 Hụnụ Onyenwe anyị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi, nʼihi na Onyenwe anyị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya, ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu.
Ku ƙaunaci Ubangiji, dukanku tsarkakansa! Ubangiji yakan adana amintattu, amma masu girman kai yakan sāka musu cikakke.
24 Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike, unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.
Ku yi ƙarfin hali ku kuma ƙarfafa, dukanku masu sa bege a kan Ubangiji.

< Abụ Ọma 31 >