< Abụ Ọma 31 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m; site nʼezi omume gị gbapụta m.
Au maître chantre. Cantique de David. Éternel, auprès de toi je me réfugie; que je ne sois jamais confondu! Par ta justice, délivre-moi!
2 Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m, bịa ngwangwa gbapụta m; ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m.
Penche vers moi ton oreille! hâte-toi! sauve-moi! Sois pour moi un rocher, un asile, une citadelle pour me sauver!
3 Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike, nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m.
Car tu es mon rocher et ma citadelle, et, pour l'amour de ton nom, tu me guideras et tu me conduiras,
4 Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m, nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike.
tu me tireras des rets cachés par eux sous mes pas, car tu es mon soutien!
5 Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m; gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu.
Je confie à tes mains la garde de ma vie; tu me délivreras, Dieu fidèle.
6 Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru; ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi m.
Je hais les adorateurs des vaines idoles, et c'est dans l'Éternel que je mets mon espoir,
7 Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị, nʼihi na ị hụrụ nsogbu m marakwa ihe mgbu nke mmụọ m.
Je serai réjoui et transporté de ta grâce; de ce que tu auras pris garde à ma misère, et fait attention aux angoisses de mon âme,
8 I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m, kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ.
ne me livrant pas aux mains de l'ennemi, mais ouvrant à mes pieds une voie spacieuse.
9 O Onyenwe anyị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m. Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa; ike adịghịkwa m.
Éternel, aie pitié de moi! car je suis angoissé, le chagrin ronge mes yeux, mon âme et mon sein.
10 Iru ụjụ eriela m ahụ; ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m; ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa m ruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m.
Car ma vie se consume dans la douleur, et mes années dans les soupirs; ma force succombe à ma peine, et mes os sont minés.
11 Nʼihi ndị iro m niile; ndị agbataobi m na-elelị m anya. Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m, ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee.
A cause de tous mes ennemis je suis un opprobre, le grand opprobre même de mes voisins, et la terreur de mes amis; ceux qui me voient dans la rue, me fuient.
12 Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ. A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m.
Je suis oublié comme un mort, banni de la pensée, je suis comme un vase mis au rebut;
13 Anụla m nkwulu ha megide m; oke egwu dị nʼakụkụ niile; ha na-agba izu megide m, na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m.
car j'entends les sourds propos de plusieurs, de toute part l'alarme me vient, quand ensemble ils se concertent contre moi; ils complotent de m'ôter la vie.
14 Ma ana m atụkwasị gị obi Onyenwe anyị. Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.”
Mais en toi je me confie, Éternel! Je dis: Tu es mon Dieu!
15 Oge m niile dị gị nʼaka. Napụta m nʼaka ndị iro m na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ.
Mes instants sont en ta main; tire-moi de la main de mes ennemis et de mes oppresseurs!
16 Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ; zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ.
Fais luire ta face sur ton serviteur! Sauve-moi dans ta clémence!
17 O Onyenwe anyị, ekwela ka ihere mee m, nʼihi na akpọkuola m gị; kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ, ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu. (Sheol h7585)
Éternel, que je ne sois pas confondu, car je t'invoque! Confonds les impies! que, réduits au silence, ils deviennent la proie des Enfers! (Sheol h7585)
18 Ka ọnụ ahụ ha ji ekwu okwu ụgha mechie kpamkpam; nʼihi na ọ bụ site na mpako na nlelị ka ha ji na-ekwu okwu megide ndị ezi omume.
Rends muettes les lèvres menteuses, qui tiennent contre le juste des discours violents, avec orgueil et mépris!
19 Lee ka ịdị mma gị si baa ụba, nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị, nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị, nʼihu ọha mmadụ.
Quelle est grande la bonté que tu gardes à tes saints, que tu témoignes à ceux qui se confient en toi, à la face des hommes!
20 I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ; ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị; ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche.
Tu les protèges de l'abri de ta face contre les complots des hommes; tu les dérobes dans ta loge aux attaques de la langue.
21 Otuto dịrị Onyenwe anyị nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu.
Béni soit l'Éternel, de ce qu'il signala sa bonté envers moi, et me mit comme dans une ville forte!
22 Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị, “Ewezugala m site nʼihu ya!” Ma ị nụrụ arịrịọ m maka ebere mgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka.
Je disais dans mes alarmes: Je suis banni de ta présence. Mais tu écoutas ma voix suppliante, quand je t'implorai.
23 Hụnụ Onyenwe anyị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi, nʼihi na Onyenwe anyị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya, ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu.
Aimez l'Éternel, vous tous ses saints! L'Éternel garde les fidèles, et paie à l'orgueilleux un abondant salaire.
24 Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike, unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.
Prenez courage, et que votre cœur s'assure, vous tous qui espérez dans l'Éternel!

< Abụ Ọma 31 >