< Abụ Ọma 30 >

1 Abụ Ọma. Abụ nke ido obieze Devid nsọ. Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị.
Saamu. Orin. Fún ìyàsímímọ́ Tẹmpili. Ti Dafidi. Èmi yóò kókìkí i rẹ, Olúwa, nítorí ìwọ ni ó gbé mi lékè tí ìwọ kò sì jẹ́ kí àwọn ọ̀tá mi kí ó yọ̀ mí.
2 O Onyenwe anyị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka, ị gwọkwara m.
Olúwa Ọlọ́run mi, èmi ké pè ọ́ fún ìrànlọ́wọ́, ìwọ sì ti wò mí sàn.
3 O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ. (Sheol h7585)
Olúwa, ìwọ ti yọ ọkàn mi jáde kúrò nínú isà òkú, mú mi padà bọ̀ sípò alààyè kí èmi má ba à lọ sínú ihò. (Sheol h7585)
4 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya.
Kọ orin ìyìn sí Olúwa, ẹ̀yin olódodo; kí ẹ sì fi ọpẹ́ fún orúkọ rẹ̀ mímọ́.
5 Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.
Nítorí pé ìbínú rẹ̀ wà fún ìgbà díẹ̀, ojúrere rẹ̀ wà títí ayérayé; ẹkún lè pẹ́ títí di alẹ́, ṣùgbọ́n ayọ̀ yóò wá ní òwúrọ̀.
6 Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m, “Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m.”
Ní ìgbà ayé mi, mo wí pé, “a kì yóò ṣí mi ní ipò padà.”
7 O Onyenwe anyị, mgbe i gosiri m ihuọma, i mere ka m kwụrụ chịm dịka ugwu; ma mgbe i zoro ihu gị site nʼebe m nọ, adara m mba.
Nípa ojúrere rẹ, Olúwa, ìwọ ti gbé mi kalẹ̀ bí òkè tí ó ní agbára; ìwọ pa ojú rẹ mọ́, àyà sì fò mí.
8 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, ka m kpọkuru; ọ bụkwa onyenwe anyị ka m rịọrọ arịrịọ amara sị,
Sí ọ Olúwa, ni mo ké pè é; àti sí Olúwa ni mo sọkún fún àánú:
9 “Uru gịnị dị ma m laa nʼiyi? Uru gịnị dị ma m rịda nʼili? Uzuzu aja ọ ga-enye gị otuto? Ọ ga-ekwusa banyere ikwesi ntụkwasị obi gị?”
“Èrè kí ni ó wà nínú ikú ìparun mi, nínú lílọ sí ihò mi? Eruku yóò a yìn ọ́ bí? Ǹjẹ́ yóò sọ nípa òdodo rẹ?
10 O Onyenwe anyị, gee m ntị ma meere m ebere; O Onyenwe anyị, bụụrụ m onye inyeaka.
Gbọ́, Olúwa, kí o sì ṣàánú fún mi; ìwọ Olúwa, jẹ́ olùrànlọ́wọ́ mi.”
11 I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme.
Ìwọ ti yí ìkáàánú mi di ijó fún mi; ìwọ sì ti bọ́ aṣọ ọ̀fọ̀ mi, o sì fi aṣọ ayọ̀ wọ̀ mí,
12 I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ. O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.
nítorí ìdí èyí ni kí ọkàn mi máa yìn ọ́, kí o má sì ṣe dákẹ́. Ìwọ Olúwa Ọlọ́run mi, èmi yóò máa fi ọpẹ́ fún ọ títí láé.

< Abụ Ọma 30 >