< Abụ Ọma 30 >

1 Abụ Ọma. Abụ nke ido obieze Devid nsọ. Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị.
מזמור שיר-חנכת הבית לדוד ב ארוממך יהוה כי דליתני ולא-שמחת איבי לי
2 O Onyenwe anyị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka, ị gwọkwara m.
יהוה אלהי-- שועתי אליך ותרפאני
3 O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ. (Sheol h7585)
יהוה--העלית מן-שאול נפשי חייתני מיורדי- (מירדי-) בור (Sheol h7585)
4 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya.
זמרו ליהוה חסידיו והודו לזכר קדשו
5 Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.
כי רגע באפו-- חיים ברצונו בערב ילין בכי ולבקר רנה
6 Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m, “Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m.”
ואני אמרתי בשלוי-- בל-אמוט לעולם
7 O Onyenwe anyị, mgbe i gosiri m ihuọma, i mere ka m kwụrụ chịm dịka ugwu; ma mgbe i zoro ihu gị site nʼebe m nọ, adara m mba.
יהוה-- ברצונך העמדתה להררי-עז הסתרת פניך הייתי נבהל
8 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, ka m kpọkuru; ọ bụkwa onyenwe anyị ka m rịọrọ arịrịọ amara sị,
אליך יהוה אקרא ואל-אדני אתחנן
9 “Uru gịnị dị ma m laa nʼiyi? Uru gịnị dị ma m rịda nʼili? Uzuzu aja ọ ga-enye gị otuto? Ọ ga-ekwusa banyere ikwesi ntụkwasị obi gị?”
מה-בצע בדמי ברדתי אל-שחת היודך עפר היגיד אמתך
10 O Onyenwe anyị, gee m ntị ma meere m ebere; O Onyenwe anyị, bụụrụ m onye inyeaka.
שמע-יהוה וחנני יהוה היה-עזר לי
11 I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme.
הפכת מספדי למחול לי פתחת שקי ותאזרני שמחה
12 I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ. O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.
למען יזמרך כבוד-- ולא ידם יהוה אלהי לעולם אודך

< Abụ Ọma 30 >