< Abụ Ọma 3 >

1 Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ. O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.
מזמור לדוד בברחו מפני אבשלום בנו יהוה מה רבו צרי רבים קמים עלי׃
2 Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị, “Chineke agaghị azọpụta ya.” (Sela)
רבים אמרים לנפשי אין ישועתה לו באלהים סלה׃
3 Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m; I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.
ואתה יהוה מגן בעדי כבודי ומרים ראשי׃
4 Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. (Sela)
קולי אל יהוה אקרא ויענני מהר קדשו סלה׃
5 Edinara m ala, hie ụra, ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.
אני שכבתי ואישנה הקיצותי כי יהוה יסמכני׃
6 A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu, agaghị m atụ egwu ọbụla.
לא אירא מרבבות עם אשר סביב שתו עלי׃
7 Bilie Onyenwe anyị! Zọpụta m Chineke m! Tie ndị iro m niile aka nʼagba; tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ.
קומה יהוה הושיעני אלהי כי הכית את כל איבי לחי שני רשעים שברת׃
8 Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa. Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. (Sela)
ליהוה הישועה על עמך ברכתך סלה׃

< Abụ Ọma 3 >