< Abụ Ọma 29 >

1 Abụ Ọma Devid. Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya.
A Psalm of David. Ascribe to Jehovah, ye sons of the mighty, Ascribe to Jehovah honour and strength.
2 Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya; kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya.
Ascribe to Jehovah the honour of His name, Bow yourselves to Jehovah, In the beauty of holiness.
3 Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri; olu Chineke dị ebube na-ada ike ike, olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe nʼelu oke osimiri.
The voice of Jehovah [is] on the waters, The God of glory hath thundered, Jehovah [is] on many waters.
4 Olu Onyenwe anyị dị ike, olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube.
The voice of Jehovah [is] with power, The voice of Jehovah [is] with majesty,
5 Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida; Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn.
The voice of Jehovah [is] shivering cedars, Yea, Jehovah shivers the cedars of Lebanon.
6 Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi, ọ na-eme ka Siriọn wulie elu dịka nwa atụ.
And He causeth them to skip as a calf, Lebanon and Sirion as a son of Reems,
7 Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe mgbe amụma na-egbu.
The voice of Jehovah is hewing fiery flames,
8 Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji; Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji.
The voice of Jehovah paineth a wilderness, Jehovah paineth the wilderness of Kadesh.
9 Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa. Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!”
The voice of Jehovah paineth the oaks, And maketh bare the forests, And in His temple every one saith, 'Glory.'
10 Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri; Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.
Jehovah on the deluge hath sat, And Jehovah sitteth king — to the age,
11 Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike, ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya.
Jehovah strength to his people giveth, Jehovah blesseth His people with peace!

< Abụ Ọma 29 >