< Abụ Ọma 28 >
1 Abụ Ọma Devid. Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku; gị bụ Oke nkume m, agbala m nkịtị. Ọ bụrụ na ị jụ ịza m, aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu.
Kenka, O Yahweh, umawagak; sika a Batok, ipangagnak. No saannak nga ipangag, maitiponakto kadagiti maitanem.
2 Nụrụ arịrịọ m maka ebere dịka m na-akpọku gị maka enyemaka, mgbe m chịlịri aka m abụọ elu nʼEbe gị Kachasị Nsọ.
Denggem ti uni ti pakaasik no dumawatak iti tulong manipud kenka, inton ingatok dagiti imak nga agturong iti kasasantoan a lugarmo!
3 Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ, tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe, ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo, ma ha bu iro nʼime obi ha.
Saannak nga iguyod a kadua dagiti nadangkes, dagiti agar-aramid kadagiti dakes, dagiti makikapkapia kadagiti kaarrubada ngem adda kinadakes kadagiti pusoda.
4 Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ ha na omume ha kwesiri; kwụghachi ha maka ihe aka ha mere, ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa.
Itedmo kadakuada ti maikari kadagiti aramidda ken dusaem ida iti maiparbeng iti kinadangkesda; dusaem ida gapu kadagiti aramid dagiti imada; ipaaymo ti rumbeng kadakuada.
5 Nʼihi na ha adịghị aghọta ọrụ niile nke Onyenwe anyị, ha adịghịkwa aghọta ihe aka ya abụọ rụrụ, ọ ga-akwada ha nʼala, ọ gaghị ewulikwa ha elu ọzọ.
Gapu ta saanda a maawatan dagiti wagas ni Yahweh wenno dagiti aramid dagiti imana, rebbaennanto ida ket pulos a saannan ida a bangonen.
6 Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere.
Madaydayaw ni Yahweh agsipud ta nangngegna ti uni ti panagpakpakaasik!
7 Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m; ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka. Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ, aga m ejikwa abụ m na-eto ya.
Ni Yahweh ti pigsa ken kalasagko; agtaltalek ti pusok kenkuana, ket natulonganak. Ngarud ti pusok agragrag-o iti kasta unay, ket daydayawek isuna babaen iti panagkankanta.
8 Onyenwe anyị bụ ike nke ndị ya, ebe mgbaba e wusiri ike nke nzọpụta dịịrị onye ya etere mmanụ.
Ni Yahweh ti pigsa dagiti tattaona, ken isuna ti mangisalakan a pagkamangan iti pinulutanna.
9 Zọpụta ndị gị, gọzikwaa ihe nketa gị; buuru ha onye ọzụzụ atụrụ, na-ekukwa ha ruo mgbe ebighị ebi.
Isalakanmo dagiti tattaom ken bendisionam ti tawidmo. Agbalinka a pastorda ket awitem ida iti agnanayon.