< Abụ Ọma 27 >
1 Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
Yahwe ni nuru yangu na wokovu wangu; nimuogope nani? Yahwe ni salama ya maisha yangu; ni mhofu nani?
2 Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.
Wakati waovu waliponijia kunila mwili wangu, wapinzani wangu na adui zangu walijikwaa na wakaanguka.
3 Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu, obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla; ọ bụladị na agha adaa imegide m, nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi.
Ingawa jeshi hujipanga kupigana na mimi, moyo wangu hautaogopa; japo vita vijapo inuka kupigana nami hata hapo nitabaki kuwa jasiri.
4 Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.
Kitu kimoja nimekiomba kwa Yahwe, nami nitakitafuta hicho: kwamba niweze kukaa katika nyumba ya Yahwe siku zote za maisha yangu, kuutazama uzuri wa Yahwe na kutafakari hekaruni mwake.
5 Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume.
Kwa kuwa katika siku ya shida atanificha nyumbani mwake; atanificha katika mfuniko wa hema lake. Yeye ataniinua juu ya mwamba!
6 Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị.
Kisha kichwa changu kitainuliwa juu ya maadui wote wanizungukao, nami nitatoa sadaka ya furaha hemani mwake! Nitaimba na kutunga nyimbo kwa Yahwe!
7 Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị. Meere m ebere, zaa m.
Sikia, sauti yangu nikuitapo, Yahwe! Unihurumie, na unijibu!
8 Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.
Moyo wangu huongea kuhusu wewe, “Utafute uso wake!” Nami nautafuta uso wako, Yahwe!
9 Ezonarịla m ihu gị, agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. O Chineke, Onye nzọpụta m, ahapụkwala m.
Usiufiche uso wako mbali na mimi; usinikasirikie mimi mtumishi wako! Wewe umekuwa msaada wangu; usiniache wala kunitelekeza, Mungu wa wokovu wangu!
10 Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m, Onyenwe anyị ga-anabata m.
Hata kama baba yangu na mama yangu wakiniacha, Yahwe utanitunza kwako.
11 Zi m ụzọ gị, O Onyenwe anyị; duo m nʼụzọ kwesiri nʼihi ndị na-akpagbu m.
Unifundishe njia yako, Yahwe! Kwa sababu ya adui zangu uniongoze katika njia salama.
12 Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha, ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m, ha na-ekupụ ihe ike dịka ume.
Usiwaache adui zangu wanifanyie watamanivyo, kwa sababu mashahidi wa uongo wameinuka kinyume namimi, nao wanapumua vurugu!
13 Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị nʼala ndị dị ndụ.
Kitu gani kingeweza kunitokea kama nisingeamini kuwa nitauona uzuri wa Yahwe katika nchi ya walio hai?
14 Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.
Umngoje Yahwe; uwe imara, na moyo wako uwe jasiri! Umngoje Yahwe!