< Abụ Ọma 27 >

1 Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
“A psalm of David.” The LORD is my light and my salvation; Whom shall I fear? The LORD is the shield of my life; Of whom shall I be afraid?
2 Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.
When the wicked came upon me to devour me, Even my persecutors and enemies, they stumbled and fell.
3 Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu, obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla; ọ bụladị na agha adaa imegide m, nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi.
Though a host should encamp against me, my heart shall not fear; Though war should rise against me, yet will I be confident.
4 Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.
One thing have I desired of the LORD; that do I yet seek; That I may dwell in the house of the LORD all the days of my life, To behold the grace of the LORD, And to gaze upon his temple.
5 Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume.
For in the day of trouble he will hide me in his pavilion; Yea, in the secret place of his tabernacle will he shelter me; He will set me upon a rock.
6 Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị.
Yea, already doth he lift my head above my enemies, who are around me; Therefore in his tabernacle will I offer sacrifices with the sound of trumpets; I will sing, yea, with instruments of music I will give praise to the LORD.
7 Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị. Meere m ebere, zaa m.
Hear my voice, O LORD! when I cry unto thee; Have pity upon me, and answer me!
8 Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.
When I think of thy precept, “Seek ye my face!” Thy face, LORD, do I seek.
9 Ezonarịla m ihu gị, agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. O Chineke, Onye nzọpụta m, ahapụkwala m.
O hide not thou thy face from me; Cast not thy servant away in displeasure! Thou hast been my help, do not leave me; Do not forsake me, O God, my helper!
10 Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m, Onyenwe anyị ga-anabata m.
For my father and my mother have forsaken me; But the LORD will take me up.
11 Zi m ụzọ gị, O Onyenwe anyị; duo m nʼụzọ kwesiri nʼihi ndị na-akpagbu m.
Teach me thy way, O LORD! And lead me in the right path, because of my enemies!
12 Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha, ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m, ha na-ekupụ ihe ike dịka ume.
Give me not up to the will of my adversaries! For false witnesses have risen up against me, And such as breathe out injustice.
13 Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị nʼala ndị dị ndụ.
I trust that I shall see the goodness of the LORD In the land of the living. Hope thou in the LORD!
14 Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.
Be of good courage; let thy heart be strong; Hope thou in the LORD!

< Abụ Ọma 27 >