< Abụ Ọma 26 >
1 Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị, biko kpepụta m, nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke; atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi, na-eleghị anya nʼazụ.
Dawid dwom. Bu me bem, Ao Awurade, ɛfiri sɛ, mabɔ bra a asɛm nni ho: mede me ho too Awurade so na manhinhim.
2 Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m, nyochaa obi m na echiche m.
Sɔ me hwɛ, Ao Awurade, hwehwɛ mʼakoma ne mʼadwene mu.
3 Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m. Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị.
Wʼadɔeɛ wɔ mʼanim daa na mɛnante wo nokorɛ mu.
4 Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla. Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ.
Me ne nnaadaafoɔ ntena na me ne nyaatwomfoɔ nso nni hwee yɛ.
5 Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị. Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa.
Mekyiri nnebɔneyɛfoɔ dwabɔ na mempɛ sɛ me ne amumuyɛfoɔ tena.
6 Ana m asacha aka m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ, na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị.
Mehohoro me nsa wɔ bembuo mu, na makɔ wʼafɔrebukyia ho ahyia, Ao Awurade,
7 Ana m abụkwa abụ ekele, jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile.
na mepae mu ka wʼayɛyie na meka wʼanwanwadeɛ nyinaa.
8 O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya, ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya.
Mʼani gye efie a wote mu ho, Ao Awurade, baabi a wʼanimuonyam wɔ no.
9 Ebibikọtala mụ na ndị mmehie, ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara,
Mfa me kra nka nnebɔneyɛfoɔ deɛ ho nkɔ. Mfa me nkwa nka mogyapɛfoɔ deɛ ho,
10 ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ, aka nri ha jupụtakwara na ngarị.
wɔn a amumuyɛ nhyehyɛeɛ wɔ wɔn nsam na adanmudeɛ ayɛ wɔn nsa nifa ma.
11 Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke; gbapụta m ma meere m ebere.
Nanso mebɔ ɔbra a ɛho teɛ. Hu me mmɔbɔ na gye me nkwa.
12 Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị; aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ.
Me nan sisi asase tamaa so; na dwabɔ akɛseɛ ase na mɛkamfo Awurade.