< Abụ Ọma 26 >

1 Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị, biko kpepụta m, nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke; atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi, na-eleghị anya nʼazụ.
לדוד שפטני יהוה כי אני בתמי הלכתי וביהוה בטחתי לא אמעד׃
2 Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m, nyochaa obi m na echiche m.
בחנני יהוה ונסני צרופה כליותי ולבי׃
3 Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m. Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị.
כי חסדך לנגד עיני והתהלכתי באמתך׃
4 Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla. Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ.
לא ישבתי עם מתי שוא ועם נעלמים לא אבוא׃
5 Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị. Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa.
שנאתי קהל מרעים ועם רשעים לא אשב׃
6 Ana m asacha aka m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ, na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị.
ארחץ בנקיון כפי ואסבבה את מזבחך יהוה׃
7 Ana m abụkwa abụ ekele, jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile.
לשמע בקול תודה ולספר כל נפלאותיך׃
8 O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya, ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya.
יהוה אהבתי מעון ביתך ומקום משכן כבודך׃
9 Ebibikọtala mụ na ndị mmehie, ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara,
אל תאסף עם חטאים נפשי ועם אנשי דמים חיי׃
10 ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ, aka nri ha jupụtakwara na ngarị.
אשר בידיהם זמה וימינם מלאה שחד׃
11 Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke; gbapụta m ma meere m ebere.
ואני בתמי אלך פדני וחנני׃
12 Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị; aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ.
רגלי עמדה במישור במקהלים אברך יהוה׃

< Abụ Ọma 26 >