< Abụ Ọma 25 >

1 Abụ Ọma Devid. Ọ bụ na gị Onyenwe anyị ka m tụkwasịrị obi m.
Zaburi ya Daudi. Kwako wewe, Ee Bwana, nainua nafsi yangu,
2 O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m. Ekwela ka ihere mee m, ekwekwala ka ndị iro m merie m.
ni wewe ninayekutumainia, Ee Mungu wangu. Usiniache niaibike, wala usiache adui zangu wakanishinda.
3 Ihere agaghị eme onye ọbụla olileanya ya dị na gị, ma ihere ga-eme ha bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ.
Kamwe hakuna hata mmoja anayekutegemea atakayeaibishwa, bali wataaibishwa wafanyao hila bila sababu.
4 O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile.
Nionyeshe njia zako, Ee Bwana, nifundishe mapito yako,
5 Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị.
niongoze katika kweli yako na kunifundisha, kwa maana wewe ni Mungu Mwokozi wangu, nalo tumaini langu liko kwako wakati wote.
6 Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie.
Kumbuka, Ee Bwana, rehema zako kuu na upendo, kwa maana zimekuwepo tangu zamani.
7 Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.
Usizikumbuke dhambi za ujana wangu wala njia zangu za uasi, sawasawa na upendo wako unikumbuke, kwa maana wewe ni mwema, Ee Bwana.
8 Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya.
Bwana ni mwema na mwenye adili, kwa hiyo huwafundisha wenye dhambi njia zake.
9 Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya.
Huwaongoza wanyenyekevu katika haki, naye huwafundisha njia yake.
10 Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya.
Njia zote za Bwana ni za upendo na uaminifu kwa wale wanaoshika shuhuda za agano lake.
11 Nʼihi aha gị, O Onyenwe anyị, gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu.
Ee Bwana, kwa ajili ya jina lako, unisamehe uovu wangu, ijapokuwa ni mwingi.
12 Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu Onyenwe anyị? O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya.
Ni nani basi, mtu yule anayemcha Bwana? Atamfundisha katika njia atakayoichagua kwa ajili yake.
13 Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba, ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ.
Mtu huyo atafanikiwa maishani mwake, nao wazao wake watairithi nchi.
14 Onyenwe anyị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya.
Siri ya Bwana iko kwa wale wamchao, yeye huwajulisha agano lake.
15 Anya m abụọ na-elegide Onyenwe anyị mgbe niile; nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta.
Macho yangu humwelekea Bwana daima, kwa kuwa yeye peke yake ndiye ataitoa miguu yangu kutoka mtego.
16 Chee m ihu ma gosi m ebere gị, nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa.
Nigeukie na unihurumie, kwa maana mimi ni mpweke na mwenye kuteseka.
17 Ihe mgbu nke obi m abaala ụba, napụta m site nʼobi mwute.
Shida za moyo wangu zimeongezeka, niokoe katika dhiki yangu.
18 Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya. Biko, gbaghara m mmehie m niile.
Uangalie mateso na shida zangu na uniondolee dhambi zangu zote.
19 Lee ka ndị iro m si mụbaa, ha ji oke iwe kpọọ m asị.
Tazama adui zangu walivyo wengi, pia uone jinsi wanavyonichukia vikali!
20 Chebe ndụ m ma gbapụta m; ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ
Uyalinde maisha yangu na uniokoe, usiniache niaibike, kwa maana nimekukimbilia wewe.
21 Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu, nʼihi na olileanya m dị nʼime gị.
Uadilifu na uaminifu vinilinde, kwa sababu tumaini langu ni kwako.
22 O Chineke, Gbapụtakwa Izrel, site na nsogbu ya niile.
Ee Mungu, wakomboe Israeli, katika shida zao zote!

< Abụ Ọma 25 >