< Abụ Ọma 25 >

1 Abụ Ọma Devid. Ọ bụ na gị Onyenwe anyị ka m tụkwasịrị obi m.
大卫的诗。 耶和华啊,我的心仰望你。
2 O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m. Ekwela ka ihere mee m, ekwekwala ka ndị iro m merie m.
我的 神啊,我素来倚靠你; 求你不要叫我羞愧, 不要叫我的仇敌向我夸胜。
3 Ihere agaghị eme onye ọbụla olileanya ya dị na gị, ma ihere ga-eme ha bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ.
凡等候你的必不羞愧; 惟有那无故行奸诈的必要羞愧。
4 O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile.
耶和华啊,求你将你的道指示我, 将你的路教训我!
5 Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị.
求你以你的真理引导我,教训我, 因为你是救我的 神。 我终日等候你。
6 Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie.
耶和华啊,求你记念你的怜悯和慈爱, 因为这是亘古以来所常有的。
7 Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.
求你不要记念我幼年的罪愆和我的过犯; 耶和华啊,求你因你的恩惠,按你的慈爱记念我。
8 Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya.
耶和华是良善正直的, 所以他必指示罪人走正路。
9 Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya.
他必按公平引领谦卑人, 将他的道教训他们。
10 Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya.
凡遵守他的约和他法度的人, 耶和华都以慈爱诚实待他。
11 Nʼihi aha gị, O Onyenwe anyị, gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu.
耶和华啊,求你因你的名赦免我的罪, 因为我的罪重大。
12 Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu Onyenwe anyị? O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya.
谁敬畏耶和华, 耶和华必指示他当选择的道路。
13 Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba, ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ.
他必安然居住; 他的后裔必承受地土。
14 Onyenwe anyị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya.
耶和华与敬畏他的人亲密; 他必将自己的约指示他们。
15 Anya m abụọ na-elegide Onyenwe anyị mgbe niile; nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta.
我的眼目时常仰望耶和华, 因为他必将我的脚从网里拉出来。
16 Chee m ihu ma gosi m ebere gị, nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa.
求你转向我,怜恤我, 因为我是孤独困苦。
17 Ihe mgbu nke obi m abaala ụba, napụta m site nʼobi mwute.
我心里的愁苦甚多, 求你救我脱离我的祸患。
18 Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya. Biko, gbaghara m mmehie m niile.
求你看顾我的困苦,我的艰难, 赦免我一切的罪。
19 Lee ka ndị iro m si mụbaa, ha ji oke iwe kpọọ m asị.
求你察看我的仇敌, 因为他们人多,并且痛痛地恨我。
20 Chebe ndụ m ma gbapụta m; ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ
求你保护我的性命,搭救我, 使我不致羞愧,因为我投靠你。
21 Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu, nʼihi na olileanya m dị nʼime gị.
愿纯全、正直保守我, 因为我等候你。
22 O Chineke, Gbapụtakwa Izrel, site na nsogbu ya niile.
神啊,求你救赎以色列脱离他一切的愁苦。

< Abụ Ọma 25 >