< Abụ Ọma 24 >

1 Abụ Ọma Devid. Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị; ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
A Psalm of David. To Jehovah [is] the earth and its fulness, The world and the inhabitants in it.
2 Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile, o mekwara ka o guzosie ike.
For He on the seas hath founded it, And on the floods He doth establish it.
3 Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị? Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya?
Who goeth up into the hill of Jehovah? And who riseth up in His holy place?
4 Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha, onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị, maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ.
The clean of hands, and pure of heart, Who hath not lifted up to vanity his soul, Nor hath sworn to deceit.
5 Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị, natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha.
He beareth away a blessing from Jehovah, Righteousness from the God of his salvation.
6 Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. (Sela)
This [is] a generation of those seeking Him. Seeking Thy face, O Jacob! (Selah)
7 Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka eze ebube nwee ike ịbata.
Lift up, O gates, your heads, And be lifted up, O doors age-during, And come in doth the king of glory!
8 Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dimkpa na dike. Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dike nʼagha.
Who [is] this — 'the king of glory?' Jehovah — strong and mighty, Jehovah, the mighty in battle.
9 Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, buliekwanụ ha elu, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka Eze ebube nwee ike ịbatakwa.
Lift up, O gates, your heads, And be lifted up, O doors age-during, And come in doth the king of glory!
10 Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ya bụ Eze ebube! (Sela)
Who [is] He — this 'king of glory?' Jehovah of hosts — He [is] the king of glory! (Selah)

< Abụ Ọma 24 >