< Abụ Ọma 23 >
1 Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.
INkosi ingumelusi wami, kangiyikuswela.
2 Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,
Iyangilalisa emadlelweni aluhlaza; iyangiholela emanzini okuphumula.
3 ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya.
Ibuyisa umphefumulo wami, ingiholele endleleni zokulunga ngenxa yebizo layo.
4 A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi.
Yebo, loba ngihamba esihotsheni sethunzi lokufa, kangiyikwesaba okubi, ngoba wena ulami; intonga yakho lodondolo lwakho, khona kuyangiduduza.
5 Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke.
Uyalungisa itafula phambi kwami ngaphambi kwezitha zami; ugcoba ikhanda lami ngamafutha, inkezo yami iyaphuphuma.
6 Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi.
Isibili okuhle lesihawu kuzangilandela insuku zonke zempilo yami; njalo ngizahlala endlini yeNkosi kuze kube nininini.