< Abụ Ọma 23 >

1 Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.
大衛的詩。 耶和華是我的牧者, 我必不致缺乏。
2 Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,
他使我躺臥在青草地上, 領我在可安歇的水邊。
3 ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya.
他使我的靈魂甦醒, 為自己的名引導我走義路。
4 A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi.
我雖然行過死蔭的幽谷, 也不怕遭害, 因為你與我同在; 你的杖,你的竿,都安慰我。
5 Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke.
在我敵人面前,你為我擺設筵席; 你用油膏了我的頭,使我的福杯滿溢。
6 Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi.
我一生一世必有恩惠慈愛隨着我; 我且要住在耶和華的殿中,直到永遠。

< Abụ Ọma 23 >